NKPUGHE 14 - Bible Lgbo

1M'we hu, ma le, Nwa-aturu ahu ka Ọ nēguzo n'ugwu Zaion, Ya na ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ, bú ndi edeworo aha-Ya na aha Nna-Ya n'egedege-iru-ha.

2M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe dà, dika olu ọtutu miri, di kwa ka olu oke éb͕è-elu-igwe: olu ahu m'nuru di kwa ka olu ndi nākpọ ubọ-akwara mb͕e ha nēwere ubọ-akwara-ha nākpọ:

3ha we nābù dika agāsi na ọ bu abù ọhu n'iru oche-eze ahu, na n'iru ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu: ọ dighi kwa onye ọ bula puru imuta abù ahu ma-ọbughi ọgu nnù iri na ọgu nnù asatọ ahu, bú ndi ab͕atarari n'uwa.

4Ndia bu ndi nēmerughi onwe-ha n'aru ndinyom; n'ihi na ha di ọcha ka umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke. Ndia bu ndi nēso Nwa-aturu ahu ebe ọ bula Ọ nēje. Ndia ka ab͕atara n'etiti madu, iburu Chineke na Nwa-aturu ahu nkpuru mbu.

5Ọ dighi kwa ugha ọ bula ahuru n'ọnu-ha: ha bu ndi anātaghi uta.

6M'we hu mọ-ozi ọzọ ka ọ nēfe n'etiti elu-igwe, nēnwe ozi ọma ebighi-ebi izisara ndi nānọdu n'elu uwa, bú mba nile ọ bula na ebo nile ọ bula na asusu nile ọ bula na ndi nile ọ bula;

7ọ nēwere kwa oké olu si, Tuanu egwu Chineke, nye kwa Ya otuto; n'ihi na oge hour nke ikpé-Ya abiawo: kpọ-kwa-nu isi ala nye Ya, bú Onye kère elu-igwe na ala, oké osimiri na isi-iyi nile nke miri nile.

8Mọ-ozi ọzọ, bú nke-abua, we so, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, nke meworo ka mba nile ṅua nime manya nke ọnuma nke ikwa-iko-ya.

9Mọ-ozi ọzọ, bú nke-atọ, we so ha, were oké olu si, Ọ buru na onye ọ bula nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, nānata kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ya, ma-ọbu n'aka-ya,

10ya onwe-ya gāṅu kwa nime manya nke ọnuma Chineke, nke edoziworo nāgwaghi-agwa nime iko nke iwe-Ya; agēji kwa ọku na brimstone mekpa ya aru n'iru ndi-mọ-ozi di nsọ, na n'iru Nwa-aturu ahu:

11anwuru-ọku nke nmekpa-aru-ha nārigo rue mb͕e nile ebighi-ebi; ha adighi-ezu kwa ike ehihie na abali, bú ndi nākpọ isi ala nye anu-ọhia ahu na ihe-oyiyi-ya, ma ọ buru kwa na onye ọ bula anata akàrà nke aha-ya.

12N'ebe a ka ntachi-obi ndi nsọ di, bú ndi nēdebe ihe Chineke nyere n'iwu, na okwukwe Jisus.

13M'we nu olu ka ọ nēsi n'elu-igwe da, si, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi nwuru anwu, bú ndi gānwu anwu nime Onye-nwe-ayi site n'ub͕u a: e, ka Mọ Nsọ nēkwu, ka ha we si na ndọb͕u nile ha dọb͕uru onwe-ha n'ọlu zuru ike; n'ihi na ọlu nile ha nēso ha ga.

14M'we hu, ma le, ígwé ọcha; n'elu ígwé ọcha ahu ka m'huru otù Onye yiri nwa nke madu ka Ọ nānọdu ala, nēkpu okpu-eze nke ọla-edo n'isi-Ya, mma-iwe-ihe-ubi di nkọ di kwa n'aka-Ya.

15Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu puta, nēwere oké olu tiere Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-Gi, we kwa ihe-ubi: n'ihi na oge hour iwe ihe-ubi abiaruwo; n'ihi na ihe agēwe n'ubi nke uwa achabigawo ókè.

16Onye ahu Nke nānọkwasi n'ígwé ọcha ahu we tudà mma-iwe-ihe-ubi-Ya n'elu uwa; ewe were uwa dika ihe-ubi.

17Mọ-ozi ọzọ we si n'ulo nsọ ahu nke di n'elu-igwe puta, ya onwe-ya nwe-kwa-ra mma-iwe-ihe-ubi di nkọ.

18Mọ-ozi ọzọ we si n'ebe-ichu-àjà ahu puta, bú onye nwere ike n'ebe ọku ahu di; o we were oké olu tiere onye ahu nke nwere mma-iwe-ihe-ubi di nkọ nkpu, si, Tiye mma-iwe-ihe-ubi-gi di nkọ, bipu uyọkọ nile nke vine nke uwa; n'ihi na nkpuru-vine-ya achazuwo.

19Mọ-ozi ahu we tubà mma-iwe-ihe-ubi-ya n'uwa, we bipu nkpuru-vine nke uwa, tubà ya nime ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu, nke di uku, bú nke ọnuma Chineke.

20Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n'azu obodo ahu, ọbara we si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help