ABÙ ỌMA 74 - Bible Lgbo

Maschil Esaf.

1Chineke, n'ìhi gini ka I juworo ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi?

N'ìhi gini ka iwe Gi nākwu anwuru imegide ìgwè aturu nke ọzùzù-anu-Gi?

2Cheta nzukọ-Gi, nke I nwetaworo na mb͕e ochie,

Nke I b͕aputaworo ibu ebo nke ihe-nketa-Gi;

Cheta ugwu Zaion, ebe I biworo.

3Zọlie ije ngwa ngwa ibiaru ebe nile etikpọrọ ebighi-ebi;

Onye-iro emewo ihe ọjọ nile n'ebe nsọ.

4Ndi nākpab͕u Gi ab͕ọwo uja n'etiti ebe-nzute-Gi;

Ha edowo ihe-iriba-ama nile ha ibu ihe-iriba-ama,

5Amara ha dika onye nēbuli anyu-ike elu nke-uku

N'alùghi-ulù nke osisi.

6Ma ub͕u a ihe-ya nile nke eb͕uru eb͕ub͕u,

Ha nēwere anyu-ike ntà na otùtù di iche iche tipia ya n'otù.

7Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku;

Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.

8Ha siri n'obi-ha, Ka ayi me ha ihe-ike n'otù:

Ha esurewo ebe-nzute nile nke Chineke n'ala.

9Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi:

Ọ dighi onye-amuma di ọzọ;

Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.

10Chineke, rùe ole mb͕e ka onye-nkpab͕u gāta uta?

Onye-iro, ò gēlelì aha-Gi anya rue mb͕e ebighi-ebi?

11N'ìhi gini ka I nēseghachi aka-Gi, bú aka-nri-Gi?

Seputa ya n'obi-Gi me ka ha gwusia.

12Ma Chineke bu Ezem site na mb͕e ochie,

Nke nālu ọlu nzọputa n'etiti uwa

13Gi onwe-gi were ike-Gi tiwa oké osimiri:

I tipiara isi nile nke ogologo anu-miri n'elu miri.

14Gi onwe-gi tipiasiri isi nile nke oké agu-iyi,

I nēnye ya enye iburu otù ndi ihe-oriri, bú ndi bi n'ala kpọrọ nku.

15Gi onwe-gi kewara isi-iyi na miri-iyi:

Gi onwe-gi mere ka osimiri nile nke nērù erù mb͕e nile takọrọ.

16Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali:

Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.

17Gi onwe-gi emewo ka ókè-ala nile nke uwa guzo ọtọ:

Mb͕e okpom-ọku na mb͕e oyi, Gi onwe-gi akpuwo ha.

18Cheta nka, na onye-iro atawo Jehova uta,

Cheta kwa na otù ndi di nsọkwu eleliwo aha-Gi.

19Enyela anu-ọhia nkpuru-obi nke ndi gi:

Echezọla ndu nke ndi-Gi ewedara n'ala rue mb͕e ebighi-ebi.

20Legide ọb͕ub͕a-ndu-Gi:

N'ihi na ebe nile nke b͕ara ọchichiri nke uwa juputara n'ebe-obibi nile nke ihe-ike.

21Ekwela ka onye anāzọpia azọpia lata n'ihere:

Me ka onye ewedara n'ala na ob͕eye to aha-Gi.

22Bilie, Chineke, kpe ọnu-Gi n'ikpe:

Cheta uta anāta Gi site n'ọnu onye-nsọkwu ogologo ubọchi nile.

23Echezọla olu ndi nākpab͕u Gi:

Nkpọtu nke ndi nēbili imegide Gi nāla elu mb͕e nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help