ABÙ ỌMA 16 - Bible Lgbo

Michtam nke Devid.

1Debem, Chineke: n'ihi na ab͕abàwom nime Gi.

2Asiwom Jehova, Onye-nwem ka I bu:

Ọdi-nmam adighi-eru Gi aru.

3Asiwokwam ndi nsọ ndi nọ n'uwa,

Na ndi di ebube nke ọ bu nání ihe-ha nātọm utọ:

4Ihe-nb͕u-ha gāba uba, bú ndi were chi ọzọ n'ọnọdu Jehova:

M'gaghi-awusi àjà-ihe-ọṅuṅu-ha nke ọbara,

M'gaghi-eburu kwa aha-ha n'elu eb͕ub͕ere-ọnum.

5Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom:

Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà.

6Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ;

N'ezie ihe-nketam dim ezi nma.

7M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu:

Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile.

8Edowom Jehova n'irum mb͕e nile:

N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum.

9N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù:

Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi.

10N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim;

I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi.

11I gēme ka m'mara uzọ ndu:

Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi;

E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help