ABÙ ỌMA 127 - Bible Lgbo

Abù Nrigo; nke Solomon.

1Ọ buru na Jehova ewughi ulo,

N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya:

Ọ buru na Jehova echeghi obodo,

N'efu ka onye-nche muruworo anya.

2Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala,

Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche:

Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.

3Le, ihe-nketa nke nēsi n'aka Jehova bia ka umu bu:

Ugwọ-ọlu Ọ nākwu ka nkpuru nke afọ bu.

4Dika àkú n'aka dike,

Otú a ka umu amuru na mb͕e okorọbia di.

5Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke chiriworo àkú ahu kpojue àkpà-àkú-ya:

Ihere agaghi-eme ha,

Mb͕e ha na ndi-iro-ha nēkwurita okwu n'ọnu-uzọ-ama.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help