NDI-IKPE 18 - Bible Lgbo

1Na mb͕e ahu eze adighi n'Israel: na mb͕e ahu ebo ndi Dan nāchọrọ onwe-ha ala-nketa ibiri ebiri; n'ihi na ọ dighi ala bara n'aka-ha n'ihe-nketa n'etiti ebo Israel nile rue ubọchi ahu.

2Umu Dan we si n'ab͕uru-ha ziga ndikom ise sitere n'ọnu-ọgugu-ha nile, bú ndi-dìnkpà, site na Zọra, site kwa n'Eshtaol, iledo ala ahu, na ileputa ya; ha we si ha, Jenu, leputanu ala ahu: ha we bia ugwu Efraim, rue ulo Maika, nọ ọnọdu-abali n'ebe ahu.

3Mb͕e ndi ahu nọrọ nso ulo Maika, ha onwe-ha matara olu nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai: ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, si ya, Ònye mere ka i bia ebe a? ọ̀ bu kwa gini ka gi onwe-gi nēme n'ebe a? gini ka i nwe-kwa-ra n'ebe a?

4O we si ha, Otú a na otú a ka Maika meworom, o gowokwam ọlu, m'we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.

5Ha we si ya, Biko, jua Chineke ase, ka ayi we mara ma ije-ayi, bú nke ayi onwe-ayi nēje, gāga nke-ọma.

6Onye-nchu-àjà ahu we si ha, Jenu n'udo: na ncherita-iru Jehova ka uzọ-unu di, nke unu nēje ije nime ya.

7Ndikom ise ahu we je, biarue Laish, hu ndi ahu nke bi n'etiti ya, ka ha nēbi na ntukwasi-obi, dika ọme-n'ala ndi Zaidon si di, nādi jū nātukwasi kwa obi; ọ dighi kwa onye nēme ka ihere me ha n'okwu ọ bula n'ala ahu, bú onye nēnweta ike nb͕ochi, n'ebe di ndi Zaidon anya ka ha bi, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ.

8Ha we biakute umu-nne-ha rue Zọra na Eshtaol: umu-nne-ha we si ha, Gini ka unu onwe-unu gēkwu?

9Ha si, Bilie, ka ayi rigo kwa imegide ha: n'ihi na ayi ahuwo ala ahu, ma, le, ọ di nma nke-uku: ùnu onwe-unu nāb͕a kwa nkiti? unu adila ume-ngwu ije na ibà inweta ala ahu.

10Mb͕e unu biara, unu gābiakute ndi nọ na ntukwasi-obi, ala ahu sara mbara n'aka abua: n'ihi na Chineke enyewo ya n'aka-unu; bú ebe nke ọ nādighi ihe ọ bula nke di n'uwa nakọ n'ebe ahu.

11Nnù ndikom na ọgu iri ndi ekere ihe-agha, ndi sitere n'ab͕uru ndi Dan, we si n'ebe ahu, bú Zọra na Eshtaol, bulie ije.

12Ha we rigo, ma ulo-ikwū-ha nime Kiriat-jearim, nime Juda: n'ihi nka ka ha kpọrọ ebe ahu Mahane-dan, rue ta: le, ọ di n'azu Kirian-jearim.

13Ha we si n'ebe ahu gabiga rue ugwu Efraim, biarue ulo Maika.

14Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala Laish, we za, si umu-nne-ha, Ùnu amawo na ephod na teraphim na arusi apiri api na arusi awuru awu di n'ulo ndia? ma ub͕u a, maranu ihe unu gēme.

15Ha we wezuga onwe-ha ba n'ebe ahu, biarue ulo nwa-okorọbia ahu, bú onye Livai, bú ulo Maika, jua ya ajuju bayere udo-ya.

16Nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha-ha, bú ndi sitere n'umu Dan, nēguzo kwa n'oghere ọnu-uzọ-ama.

17Ndikom ise ahu, bú ndi nējeri iledo ala ahu, we rigo, ba n'ebe ahu, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu: ma onye-nchu-àjà ahu nēguzo n'oghere ọnu-uzọ-ama, ya na nnù ndikom na ọgu iri ahu ndi ekere ihe-agha.

18Ma mb͕e ndia bara n'ulo Maika, chiri arusi ahu apiri api, na ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi ahu awuru awu, onye-nchu-àjà ahu we si ha, Gini ka unu onwe-unu nēme?

19Ha we si ya, B͕a nkiti, kpuchie aka n'ọnu-gi, soro ayi je, ghọ-kwa-ra ayi nna na onye-nchu-àjà: òle nke ka nma, ka i buru onye-nchu-àjà diri ulo nke otù nwoke, ma-ọbu ka i buru onye-nchu-àjà diri otù ebo na otù ab͕uru n'Israel?

20Obi onye-nchu-àjà ahu we di nma, o we chiri ephod ahu, na teraphim ahu, na arusi apiri api ahu, ba n'etiti ndi ahu.

21Ha we chigharia je, tiye umu-ntakiri-ha na unu-ulo-ha na àkù-ha n'iru ha.

22Mb͕e ndi ahu nọ n'ebe di ulo Maika anya, ndikom ndi nọ n'ulo nile nke di ulo Maika nso we kpọkọta onwe-ha, chukuru umu Dan.

23Ha we kpọ umu Dan òkù. Ha we chigharia iru-ha, si Maika, Gini nēme gi, na anākpọkọta gi na ndi-gi?

24Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?

25Umu Dan we si ya, Ka aghara inu olu-gi n'etiti ayi, ka ndikom ndi nkpuru-obi-ha di ilu we ghara idakwasi unu, i we kpochapu ndu-gi na ndu ezi-na-ulo-gi.

26Umu Dan we je ije-ha; Maika we hu na ndi di ike ka ha bu kari ya, o we chigharia lata n'ulo-ya.

27Ndi ahu we chiri ihe nke Maika mereri, na onye-nchu-àjà nke o nwere, ha we biakwasi Laish, biakwasi otù ndi nādi jū nānọ kwa na ntukwasi-obi, were ọnu mma-agha tib͕ue ha, sure obodo ahu n'ọku.

28Ma onye-nnaputa adighi, n'ihi na ebe di Zaidon anya ka ọ bu, ọ dighi kwa ihe ha na madu nwekọrọ; ebe ahu di kwa na ndagwurugwu nke di n'akuku Bet-rehob. Ha we wue obodo ahu, biri nime ya.

29Ha we kpọ aha obodo ahu Dan, n'aha Dan, bú nna-ha, onye amuru nye Israel: otù ọ di, Laish bu aha obodo ahu na mbu.

30Umu Dan we guzoro onwe-ha arusi ahu apiri api: Jonatan, nwa Giashom, nwa Moses, ya onwe-ya na umu-ya ndikom we buru ndi-nchu-àjà diri ebo Dan rue ubọchi emere ndi ala ahu ka ha je biri n'ala ọzọ.

31Ha we doro onwe-ha arusi apiri api nke Maika, bú nke o mere, ubọchi nile ulo Chineke di na Shailo.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help