I. IHE EMERE 14 - Bible Lgbo

1Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà na nkume, na ndi-ọ̀kà n'osisi, iwuru Devid ulo.

2Devid we mara na Jehova emewo ya ka o guzosie ike ibu eze Israel, n'ihi na ebuliwo ala-eze-ya n'elu n'ihi ndi-Ya, bú Israel.

3Devid we kuru ndinyom ọzọ nime Jerusalem: Devid we mua umu-ndikom na umu-ndinyom ọzọ.

4Ndia bu kwa aha umu o nwere na Jerusalem; Shamua, na Shobab, na Netan, na Solomon;

5na Ibha, na Elishua, na Elpelet;

6na Noga, na Nefeg, na Jafia;

7na Elishama, na Beeliada, na Elifelet.

8Ndi Filistia we nu na etere Devid manu ibu eze Israel nile, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid: Devid we nu ya, we pua n'iru ha.

9Ma ndi Filistia biara, nọdu na ndagwurugwu Refaim.

10Devid we jua Chineke ase, si, M'gārigo imegide ndi Filistia? Ì gēnye kwa ha n'akam? Jehova we si ya, Rigo; M'gēnye kwa ha n'aka-gi.

11Ha we rigorue Beal-perazim, Devid we tib͕ue ha n'ebe ahu; Devid we si, Jehova ekwopúwo megide ndi-irom site n'akam, dika nkwopú miri. N'ihi nka ka ha kpọrọ aha ebe ahu Beal-perazim.

12Ha we rapu chi nile ha n'ebe ahu; Devid we kwue, ewe sure ha n'ọku.

13Ndi Filistia we nọdu ọzọ na ndagwurugwu ahu.

14Devid we jua Chineke ase ọzọ; Chineke we si ya, Arigola iso ha: si n'ebe ha nọ ga buruburu, biakute ha na ncherita-iru osisi balsam.

15Ọ gēru kwa, mb͕e i nuru olu ikiti-ukwu n'elu osisi balsam ahu, mb͕e ahu ka i gāpu ibu agha: n'ihi na Chineke apuwo n'iru gi itib͕u ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia.

16Devid we me dika Chineke nyere ya iwu: ha we tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū ndi Filistia site na Gibeon we rue Gezea.

17Aha Devid we pua jezue n'ala nile; Jehova we tiye ujọ-ya n'aru mba nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help