ZEKARAIA 10 - Bible Lgbo

1Riọnu Jehova miri-ozuzo n'oge miri-ozuzo nke-ikpe-azu, ọbuná Jehova Nke nēme àmùmà; ọ bu kwa oké miri-ozuzo ka Ọ gēnye ha, nye onye ọ bula ihe-ọkukù n'ubi-ya.

2N'ihi na teraphim ekwuwo ajọ ihe, ndi nāju ase ahuwo ọhù ugha; ọ bu kwa nrọ ugha ka ha nēzi, n'efu ka ha nākasi madu obi: n'ihi nka ka ha buliworo ije dika ìgwè ewu na aturu, anēweda ha n'ala, n'ihi na ọ dighi onye-ọzùzù-aturu ha nwere.

3N'aru ndi-ọzùzù-aturu ka iwem di ọku, ọ bu kwa nkpi nile ka M'gēji nmehie-ha leta: n'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha eletawo ìgwè ewu na aturu-Ya, bú ulo Juda, Ọ gēme kwa ha ka ha di ka inyinya-Ya di ebube n'agha.

4N'aka-Ya ka nkume nkuku gēsi puta, n'aka-Ya ka ǹtú gēsi puta, n'aka-Ya ka uta agha gēsi puta, n'aka-Ya ka onye ọ bula nāchi n'ihe-ike gēsi puta n'otù.

5Ha gādi kwa ka ndi-dike, nāzọda ndi-iro-ha n'apiti èzí nile n'agha; ha gēbu kwa agha, n'ihi na Jehova nọyere ha: ihere gēme kwa ndi nānọkwasi inyinya.

6M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.

7Ndi Efraim gādi kwa ka dike, obi-ha gāṅuri kwa ọṅu dika site na manya-vine: e, umu-ha gāhu ya, we ṅuria; obi-ha gēteghari egwú ọṅù nime Jehova.

8M'gākpọkọta kwa ha òkù, chikọta ha; n'ihi na ab͕aputawom ha: ha gāba kwa uba otú ha baworo uba.

9M'gāgha kwa ha dika nkpuru n'etiti ndi nile di iche iche; ọ bu kwa n'ebe nile di anya ka ha gēchetam: ha gādi kwa ndu, ha na umu-ha, we lata.

10M'gēme kwa ka ha si n'ala Ijipt lata, ọ bu kwa n'Asiria ka M'gāchikọputa ha; ọ bu kwa ala Gilead na Lebanon ka M'gēme ka ha bata; agaghi-ahu-kwa-ra ha ọnọdu.

11Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.

12M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help