1Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi,
Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah
2Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa,
Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.
3Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;
Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
4Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù:
N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi,
Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah
5Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;
Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.
6Ala emewo ihe-ọmume-ya:
Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.
7Chineke gāgọzi ayi;
Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.