ABÙ ỌMA 67 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'ubọ-akwara. Abù Ọma, Abù.

1Ka Chineke mere ayi amara, gọzie ayi,

Me ka iru-Ya mua n'ebe ayi nọ; Selah

2Ka ewe mara uzọ-Gi n'uwa,

Mara nzọputa-Gi n'etiti mba nile.

3Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;

Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

4Ka mba nile ṅuria, ti kwa nkpu ọṅù:

N'ihi na I gēkpe ndi nile n'uwa ikpe ziri ezi,

Mba nile n'uwa ka I gēdu kwa. Selah

5Ka ndi nile n'uwa kele Gi, Chineke;

Ka ndi nile n'uwa kele Gi, ha nile.

6Ala emewo ihe-ọmume-ya:

Chineke, bú Chineke-ayi, gāgọzi ayi.

7Chineke gāgọzi ayi;

Nsọtu nile nke uwa gātu kwa egwu Ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help