II. IHE EMERE 24 - Bible Lgbo

1Joash b͕ara arọ asa mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze ọgu arọ abua na Jerusalem: aha nne-ya bu Zibia nke Bia-sheba.

2Joash we me ihe ziri ezi n'anya Jehova ubọchi nile nke Jehoiada, bú onye-nchu-àjà.

3Jehoiada we lutara ya ndinyom abua; o we mua umu-ndikom na umu-ndinyom.

4O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na ọ di n'obi Joash ime ka ulo Chineke di ọhu.

5O we chikọta ndi-nchu-àjà na ndi Livai, si ha, Puanu, jerue obodo nile nke Juda, chikọputa ego n'Israel nile ime ka ulo Chineke-unu di ike kwa-arọ, unu onwe-unu kwa, menu ngwa ime ihe ahu. Ma ndi Livai emeghi ngwa.

6Eze we kpọ Jehoiada, bú onye-isi, si ya, Gini mere i jughi ndi Livai ka ha si na Juda, si kwa na Jerusalem, webata ùtú nke Moses, bú orù Jehova, na nke nkpọkọta nke Israel, nke diri ulo-ikwū ihe-àmà?

7N'ihi na Atalaia, bú nwayi ahu nēmebi iwu, umu-ya ndikom tipúru ulo Chineke; ọzọ kwa, ha were ihe nsọ nile nke ulo Jehova nye Bealim.

8Eze we gwa ha, ha we me otù ib͕e, dọba ya n'ọnu-uzọ-ama ulo Jehova n'èzí.

9Ha we kpọsa na Juda na nime Jerusalem, ka ewebatara Jehova utu nke Moses, bú orù Chineke, tukwasiri Israel n'ọzara.

10Ndi-isi nile na ndi Juda nile we ṅuria ọṅu, webata ihe, tubà ya n'ib͕e ahu, rue mb͕e ha nyebìri.

11O rue, mb͕e ebubatara ib͕e ahu n'ulo-nlekọta eze site n'aka ndi Livai, mb͕e ha hu-kwa-ra na ego ahu riri nne, na ode-akwukwọ eze na onye-nlekọta nke onye-isi-nchu-àjà biara, wupu ihe di n'ib͕e, būru ya, bughachi ya n'ọnọdu-ya. Otú a ka ha mere kwa-ubọchi, ha we chikọta ego n'uba.

12Eze na Jehoiada we were ya nye ndi nēje ozi òfùfè ulo Jehova; ha we nēgo ndi nāwa nkume na ndi-ọ̀kà n'osisi ime ka ulo Jehova di ọhu, ha were kwa ya nye ndi-ọ̀kà n'ígwè na ọla ime ka ulo Jehova di ike.

13Ndi nēje ozi ahu we lua ọlu, ewe jezue ozi ahu n'aka-ha, ha we guzo ulo Chineke dika ọtùtù-ya si di, me ka o sie ike.

14Mb͕e ha lubìri, ha we weta n'iru eze na Jehoiada ego fọduru, ha we were ya mere ulo Jehova ihe, bú ihe ozi, na isure àjà-nsure-ọku, na ngaji, na ihe ọla-edo na ọla-ọcha. Ha we nēsure àjà-nsure-ọku n'ulo Jehova mb͕e nile ubọchi nile nke Jehoiada.

15Jehoiada we ghọ agadi, ubọchi ndu-ya we ju ya afọ, o we nwua; ọgu arọ isi na iri ka ọ b͕ara mb͕e ọ nwuru.

16Ha we lìe ya n'obodo Devid n'etiti ndi-eze, n'ihi na o mere ezi ihe n'Israel, na n'ebe Chineke na ulo-Ya di.

17Ma mb͕e ọnwu Jehoiada gasiri, ndi-isi Juda biara, kpọ isi ala nye eze. Mb͕e ahu eze gere ha nti.

18Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka.

19O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.

20Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.

21Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova.

22Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase.

23O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n'etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile.

24N'ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n'aka-ha, n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n'ikpe.

25Ma mb͕e ha siri n'ebe ọ nọ la, (n'ihi na ha rapuru ya n'ọtutu ọria,) ndi-orù-ya kekọtara onwe-ha imegide ya n'ihi ọbara umu Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, b͕ue ya n'elu ihe-ndina-ya, o we nwua: ha we lìe ya n'obodo Devid, ma ha elìghi ya n'ílì ndi-eze.

26Ma ndia bu ndi nēkekọta onwe-ha imegide ya; bú Zabad nwa Shimeat nwayi Amon, na Jehozabad nwa Shimrit nwayi Moab.

27Ma ihe bayere umu-ya ndikom, na iba-uba nke ibu eboro ya, na ntọ-ala ulo Chineke, le, edewo ha n'akukọ akwukwọ ndi-eze. Amazaia nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help