1Jehova ka m'kpọkuru n'ahuhu dirim,
O we zam.
2Jehova, naputa nkpuru-obim n'eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha,
Na n'ire aghughọ.
3Gini ka agēnye gi, ọ̀ bu kwa gini ka agātukwasiri gi,
Gi ire aghughọ?
4Àkú di nkọ nke dike,
Ha na icheku-ọku nke osisi broom.
5Ahuhu dirim, na anọm dika ọbìa nime Meshek,
Na ebim n'akuku ulo-ikwū nile nke Kida!
6Ogologo mb͕e di anya ka nkpuru-obim biriworo
N'akuku onye nākpọ udo asì.
7Mu onwem bu onye-udo:
Ma mb͕e m'nēkwu okwu, ndi ahu nāchọ ibu agha.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.