ABÙ ỌMA 145 - Bible Lgbo

Abù Ọma otuto; nke Devid.

1M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze;

M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

2Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi;

M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi.

3Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku;

Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya.

4Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ,

We gosi idi-ike-Gi nile.

5N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi,

Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche.

6Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa;

Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya.

7Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa,

Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya.

8Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu;

Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere.

9Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di;

Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile.

10Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova;

Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi.

11Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa,

Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya;

12Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile,

Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya.

13Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi,

Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile.

14Jehova nākwagide ndi nile nāda ada,

O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala.

15Anya ihe nile nēle anya Gi;

Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya.

16I nāsaghe aka-Gi,

I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya.

17Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile,

Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile.

18Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya,

Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu.

19Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme;

Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha.

20Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya;

Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu.

21Otuto Jehova ka ọnum gēkwu;

Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help