NDI-HIBRU 1 - Bible Lgbo

1Chineke, mb͕e Ọ gwarari nna-ayi-hà okwu n'oge ochie nime ndi-amuma n'iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche,

2Ọ gwara ayi okwu n'ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n'aka-Ya me uwa nile;

3Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;

4ebe emere Ya-ri ka Ọ ka ndi-mọ-ozi nma n'uzọ ra otú O ketawa aha nke ka nma.

5N'ihi na ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka Ọ siri mb͕e ọ bula,

Ọkparam ka Gi onwe-gi bu,

Mu onwem amuwo Gi ta?

ọzọ kwa,

Mu onwem gāburu Ya Nna,

Ya onwe-ya gābu-kwa-ram Ọkpara?

6Ma ọzọ kwa, mb͕e ọ bula Ọ gākpọbatawori Ọkpara ahu n'elu-uwa ebe madu bi, Ọ si, Ka ndi-mọ-ozi nile nke Chineke kpọ kwa isi ala nye Ya.

7Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si,

Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe,

Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:

8ma Ọ nēkwu ihe bayere Ọkpara ahu, si,

Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi;

Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka nke ala-eze-Gi bu kwa.

9I huru ezi omume n'anya, we kpọ nmebi-iwu asì;

N'ihi nka Chineke, bú Chineke-Gi, tere Gi

Manu obi-utọ n'isi kari ndi-nketa-ibe-Gi.

10Ọzọ kwa,

Gi onwe-gi, Onye-nwe-ayi, na mbu ka I tọrọ ntọ-ala nke uwa;

Ọlu aka-Gi ka elu-igwe bu kwa:

11Ha onwe-ha gāla n'iyì; ma Gi onwe-gi nānọgide:

Ha nile gāka kwa nká dika uwe;

12Dika ákwà-nb͕okwasi ka I gāpiakọta kwa ha,

Dika uwe, agāb͕anwe kwa ha:

Ma Gi onwe-gi bu Onye ahu Nke nādi mb͕e nile,

Arọ-Gi nile agaghi-agwu kwa agwu.

13Ma ọ̀ bu onye n'etiti ndi-mọ-ozi ka O kwuworo okwu bayere ya mb͕e ọ bula, si,

Nọdu ala n'aka-nrim,

Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-Gi ka ihe-nb͕akwasi ukwu-Gi abua?

14Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help