ABÙ ỌMA 141 - Bible Lgbo

Abù Ọma Devid.

1Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ:

Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi.

2Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi;

Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi.

3Jehova, Do nche n'iru ọnum;

Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua.

4Ewezugala obim ime ihe ọjọ,

Iji nmebi-iwu nēme omume,

Mu na madu ndi nālu ajọ ihe:

Ekwe-kwa-la ka m'rie ihe ọ bula nihe-utọ n'ile ha.

5Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere;

Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi;

Ekwela ka isim si, É-è:

N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile.

6Atudawo ndi-ikpe-ha n'akuku nkume di elu;

Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n'ihi na ha di utọ.

7Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala,

Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ.

8N'ihi na ọ bu n'ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di:

Nime Gi ka m'b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri.

9Debem ka m'ghara idabà n'ib͕udu ha sirim,

Na n'ọnyà ndi nālu ajọ ihe.

10Ka ndi nēmebi iwu dabà n'ub͕u nile nke aka ha n'otù n'otù,

Rue mb͕e mu onwem gāgabiga.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help