JOSHUA 8 - Bible Lgbo

1Jehova we si Joshua, Atula egwu, atu-kwa-la ujọ: chiri ndi-agha nile tiyere onwe-gi, bilie, rigorue Ai: le, enyewom eze Ai, na ndi-ya, na obodo-ya, na ala-ya, n'aka-gi:

2i gēme kwa Ai, me kwa eze-ya, dika i mere Jeriko, me kwa eze-ya: nání, na unu gālutara onwe-unu n'agha ihe-nkwata-ya, na anu-ulo-ya: doro onwe-gi ndi nēru nbì megide obodo ahu n'azu ya.

3Joshua we bilie, ya na ndi-agha nile, irigoru Ai: Joshua we rọputa orú nnù ndikom uzọ atọ na nnù ndikom iri-na-ise, ndi-dike, bú ndi-dìnkpà, o we zipu ha n'abali.

4O we nye ha iwu, si, Lenu, unu onwe-unu nēru nbì megide obodo ahu, n'azu obodo: unu esila n'obodo ahu je n'ebe di anya nke-uku, buru-kwa-nu ndi nọ na njikere, unu nile:

5mu onwem, na ndi nile mu na ha nọ, gābiaru obodo ahu nso: ọ gēru kwa, mb͕e ha gāputa izute ayi, dika na mb͕e mbu, na ayi gāb͕alaga n'iru ha;

6ha gāputa n'azu ayi, rue mb͕e ayi gādọpu ha n'obodo; n'ihi na ha gāsi, Ha nāb͕alaga n'iru ayi, dika na mb͕e mbu; ayi gāb͕alaga kwa n'iru ha:

7unu onwe-unu gēsi kwa n'oruru-nbì ahu bilie, nweta obodo ahu: n'ihi na Jehova, bú Chineke-unu, gēnye ya n'aka-unu.

8Ọ gēru kwa, mb͕e unu wereworo obodo ahu, na unu gēsu obodo ahu ọku; dika okwu Jehova si di, otú a ka unu gēme: lenu, enyewom unu iwu.

9Joshua we zipu ha: we je n'oruru-nbì ahu, we nọdu n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu Ai: Joshua we nọ ọnọdu-abali ahu n'etiti ndi Israel.

10Joshua we bilie n'isi-ututu, lekọta ndi Israel, rigo, ya onwe-ya na ndi-okenye Israel, n'iru ndi Israel, rue Ai.

11Ndi nile, bú ndi-agha ndi ya na ha nọ, we rigo, biarue nso, bia na ncherita-iru obodo ahu, ma ulo-ikwū-ha n'akuku Ugwu nke Ai: ma ndagwurugwu di n'etiti ya na Ai.

12O we chiri ihe ra ka nnù ndikom iri-na-abua na ọgu iri, do ha n'oruru-nbì n'etiti Bet-el na Ai, n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu.

13Ndi Israel we do ọmuma-ulo-ikwū ahu nile nke di n'akuku Ugwu obodo ahu, na ndi-ha ndi nēche anwu n'akuku Ọdida-anyanwu obodo ahu; Joshua we je n'etiti ndagwurugwu ahu n'abali ahu.

14O rue, mb͕e eze Ai huru nke ahu, na ndikom obodo-ya mere ngwa, bilie n'isi-ututu, pua izute Israel ibu agha, ya onwe-ya na ndi-ya nile, na mb͕e akara àkà, n'iru Araba ahu; ma ya onwe-ya amaghi na ndi nēru nbì di megide ya n'azu obodo-ya.

15O we di ka anētib͕u Joshua na Israel nile n'iru ha, ha we b͕alaga n'uzọ ọzara.

16Ewe tikue ndi nile nọ n'obodo ahu nkpu ichu ha n'azu: ha we chua Joshua n'azu, ewe dọpu ha n'obodo.

17Ọ dighi kwa nwoke fọduru na Ai ma-ọbu na Bet-el, nke nāpughi ichu Israel: ha we rapu obodo ahu ka o ghere oghe, we chua Israel n'azu.

18Jehova we si Joshua, Zo nkpunkpu ube nke di n'aka-gi n'ebe Ai di; n'ihi na n'aka-gi ka M'gēnye ya. Joshua we zo nkpunkpu ube ahu nke di n'aka-ya n'ebe obodo ahu di.

19Ndi nēru nbì we si n'ọnọdu-ha bilie ngwa ngwa, we b͕a ọsọ mb͕e o setiri aka-ya, ha we ba n'obodo, were ya; ha we me ngwa sue obodo ahu ọku.

20Ndikom Ai we le anya n'azu ha, hu, ma, le, anwuru-ọku obodo-ha rigoro rue elu-igwe, ike adighi kwa nime ha ib͕alaga otù uzọ ọzọ: ndi Israel ndi nāb͕alaga n'ọzara we chigharia imegide ndi nāchu ha.

21Joshua na Israel nile-hukwara na ndi nēru nbì ewerewo obodo ahu, hu kwa na anwuru-ọku obodo arigowo n'elu, ha we laghachi, tib͕ue ndikom Ai.

22Ndi nēru nbì si kwa n'obodo puta izute ha; ha we nọ n'etiti Israel, ndi si n'ọzara nọ n'otù akuku, ndi si n'obodo nọ kwa n'akuku ọzọ: ha we tib͕ue ha rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ma-ọbu onye b͕apuru ab͕apu arapuru ha.

23Ha we were eze Ai na ndu, me ka ọ biarue Joshua nso.

24O rue, mb͕e Israel b͕usiri ndi nile bi na Ai n'ọhia, bú n'ọzara ebe ha churu ha, mb͕e ha nile dasiri n'ọnu mma-agha, rue mb͕e ha gwusiri, na Israel nile laghachiri na Ai, ọnu mma-agha tib͕ue ya.

25Ndi nile ndi dara n'ubọchi ahu, ma nwoke ma nwayi, we di orú nnù madu na nnù iri, bú ndikom nile nke Ai.

26Ma Joshua eseghachighi aka-ya, nke o ji zo nkpunkpu ube ahu, rue mb͕e o wezugasiri ndi nile bi na Ai ka ebibie ha.

27Nání na Israel lutara n'onwe-ha anu-ulo na ihe-nkwata nke obodo ahu n'agha, dika okwu Jehova si di nke O nyere Joshua n'iwu.

28Joshua we sure Ai ọku, do ya ka ọ buru obo ebighi-ebi, bú ebe tọb͕ọrọ n'efu, rue ta.

29Ọ we kwuba eze Ai n'osisi rue mb͕e anyasi: ma mb͕e anyanwu nāda Joshua nyere iwu, ha we si n'osisi weda ozu-ya, tuda ya n'oghere ọnu-uzọ-ama obodo, guzo n'elu ya oké obo nkume, rue ta.

30Mb͕e ahu Joshua wuru ebe-ichu-àjà nye Jehova, bú Chineke Israel, n'ugwu Ibal,

31dika Moses, bú orù Jehova, nyere umu Israel iwu, dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, bú ebe-ichu-àjà nkume zuru okè, nke ọ nēmeghi ka ígwè ga n'elu ha: ha we surere Jehova àjà-nsure-ọku n'elu ya, chu kwa àjà-udo.

32O we dekwasi na nkume ahu n'ebe ahu ndeputa iwu Moses, nke o dere n'akwukwọ n'iru umu Israel.

33Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.

34Emesia o we gua okwu nile nke iwu ahu, ma ngọzi ma nkọcha, dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ iwu ahu.

35Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help