ABÙ ỌMA 108 - Bible Lgbo

Abù, Abù Ọma Devid.

1Edoziwo obim, Chineke;

M'gābù abù, e, m'gābù abù ọma, ọbuná nsọpurum ka m'gēji bù abù.

2Teta, une na ubọ-akwara: M'gākpọte chi-ọbubọ.

3M'gēkele Gi n'etiti ndi nile di iche iche, Jehova:

M'gābùku kwa Gi abù ọma netiti mba nile.

4N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe,

Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.

5Me Onwe-gi ka I di elu n'elu elu-igwe nile, Chineke:

Ka ebube-Gi di kwa n'elu uwa nile.

6Ka ewe dọputa ndi I huru n'anya,

Were aka-nri-Gi zọputa, za kwa ayi.

7Chineke ekwuwo okwu n'idi-nsọ-Ya: ka m'ṅuria ọṅu-agha:

M'gēkè Shekem, tù kwa ndagwurugwu Sukot.

8Mu nwe Gilead; mu nwe Manase;

Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim;

Juda bu nkpa-n'aka-ezem.

9Moab bu ite ọsisa-arum;

N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum:

N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.

10Ònye gēdubàm nke-ọma n'obodo ewusiri ike?

Ònye duruworom rue Edom?

11Ọ̀ bughi Gi, Chineke, juworo ayi aju?

I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha-ayi, Chineke.

12Yere ayi aka ka ayi pua n'aka onye-nkpab͕u:

N'ihi na ihe-efu ka nzọputa madu bu.

13Nime Chineke ayi gēme ihe dìnkpà:

Ọ bu kwa Ya onwe-ya gāzọda ndi nākpabu ayi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help