JEREMAIA 27 - Bible Lgbo

1Na nmalite ọbubu-eze Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, ka okwu a ruru Jeremaia nti site na Jehova, si,

2Otú a ka Jehova sirim: Mere onwe-gi ab͕u di iche iche na nkpọrọ di iche iche, tukwasi ha n'olu-gi;

3chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n'aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda;

4nye ha iwu inye ndi-nwe-ha, si, Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Otú a ka unu gāsi ndi-nwe-unu;

5Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n'elu uwa, site n'ikem di uku, site kwa n'ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n'anyam inye.

6Ma ub͕u a Mu onwem enyewo ala nile ndia n'aka Nebukadneza, bú eze Babilon, bú orùm; ọzọ kwa, anu ọhia ka M'nyeworo ya ifè ya.

7Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.

8O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.

9Ma unu onwe-unu, unu egela ndi-amuma-unu nti, ege-kwa-la ndi-unu nāju arusi ase, ege-kwa-la nrọ nile unu, ege-kwa-la ndi-unu nēji igwe-oji tu isi ọma ma-ọbu isi ọjọ, ege-kwa-la ndi-mb͕asi-unu, ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efe eze Babilon:

10n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu, ime ka unu si n'ala-unu je n'ebe di anya: ka M'we chupu kwa unu, unu ewe la n'iyì.

11Ma mba ahu nke gēme ka olu-ya ba na yoke nke eze Babilon, nke gēfe kwa ya, M'gēkwe kwa ka mba ahu nọdu n'elu ala-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ha gālu kwa ya, biri kwa nime ya.

12Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, ka m'gwara okwu dika okwu nile ndia si di, si, Menu ka olu-unu ba na yoke nke eze Babilon, fè-kwa-nu ya na ndi-ya, we di ndu.

13N'ìhi gini ka unu gānwu, gi onwe-gi na ndi-gi, site na mma-agha, na site n'oké unwu, na site n'ajọ ọria nēfe efe, dika Jehova kwuworo bayere mba ahu nke nāgaghi-efe eze Babilon?

14Ma unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma ndi nāgwa unu okwu, si, Unu agaghi-efé eze Babilon: n'ihi na amuma ugha ka ha nēburu unu.

15N'ihi na eziteghm ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ma ha onwe-ha nēbu amuma ugha n'aham; ka M'we chupu unu, unu ewe la n'iyì, unu onwe-unu na ndi-amuma ndi nēburu unu amuma.

16Ọ bu kwa ndi-nchu-àjà na ndi nka nile ka m'gwara okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Unu egela nti okwu nile nke ndi-amuma-unu ndi nēburu unu amuma, si, Le, agaje isi na Babilon welata ihe nile nke ulo Jehova ub͕u a ngwa ngwa: n'ihi na amuma ugha ka ndi ahu nēburu unu.

17Unu egela ha nti; fènu eze Babilon, we di ndu: n'ìhi gini ka obodo a gāghọ nkpọnkpọ ebe?

18Ma ọ buru na ndi-amuma ka ha bu, ọ buru na okwa na okwu Jehova di ha n'ọnu, biko, ka ha riọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha aririọ, ka ihe nile nke fọduru n'ulo Jehova, na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, we ghara ibà na Babilon.

19N'ihi na okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru bayere ogidi nile, baye-kwa-ra oké osimiri ahu, baye-kwa-ra ihe-ndọkwasi nile, baye-kwa-ra ihe fọduru, bú nke fọduru n'obodo a,

20nke Nebukadneza, bú eze Babilon, nāchighi, mb͕e o mere ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, si na Jerusalem je biri na Babilon, ya na ndi Juda na Jerusalem nile amara aha-ha;

21e, okwu di otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Irael, kwuru bayere ihe nile fọduru n'ulo Jehova na n'ulo eze Juda, na nime Jerusalem, si:

22na Babilon ka agēbubà ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha gādi, rue ubọchi M'gēleta ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); mb͕e ahu ka M'gēbugota ha, bulata n'ebe a.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help