ZEKARAIA 8 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we bia, si,

2Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Zaion oké ekworo, ejiwokwam oké ọnuma kworo ya ekworo.

3Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.

4Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu ala ọzọ n'amá nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n'aka-ya n'aka-ya site n'iba-uba nke ubọchi ndu-ya.

5Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n'umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwú n'amá-ya nile.

6Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Asi na ọ dikari ike ime n'anya ndi nka fọduru n'ubọchi ahu, ọ̀ bu kwa n'anyam ka ọ gādi kari ike ime? (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

7Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Le, M'gaje izọputa ndim n'ala Ọwuwa-anyanwu, na n'ala Ọdida-anyanwu:

8M'gēme kwa ka ha bia, ha gēbi kwa n'etiti Jerusalem: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke, n'ezi-okwu na n'ezi omume.

9Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ka aka-unu di ike, unu ndi nānu n'ubọchi ndia okwu ndia n'ọnu ndi-amuma ahu, ndi nọ n'ubọchi mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú ulo uku Ya, ka ewe wue ya.

10N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.

11Ma ub͕u a ọ bughi dika n'ubọchi mbu nile ka Mu onwem gādiri ndi nka fọduru; (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta).

12N'ihi na nkpuru udo gādi; osisi vine gāmi nkpuru-ya, ala ēme kwa ihe-ọmume-ya, elu-igwe gēnye igirigi-ha; M'gēme kwa ka ndi nka fọduru keta ihe ndia nile.

13Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n'etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M'gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike.

14N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Dika M'zubere ime unu ihe ọjọ, mb͕e nna-unu-hà kpasurum iwe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ma echègharighm uche:

15otú a ka M'zubewo-kwa-ra ọzọ n'ubọchi ndia ime Jerusalem, ime kwa ulo Juda, nma: unu atula egwu.

16Ndia bu ihe unu gēme; Kwuenu, onye ọ bula ọ gwa ibe-ya, ezi-okwu; Kpenu ikpe ezi-okwu na ikpe udo n'ọnu-uzọ-ama nile unu:

17unu echè-kwa-la ihe ọjọ n'obi-unu, onye ọ bula megide ibe-ya; unu ahu-kwa-la ọb͕ub͕a-iyi ugha n'anya: n'ihi na ihe ndia nile bu ihe nke M'kpọworo asì; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

18Okwu Jehova nke usu nile nke ndi-agha we ruem nti, si,

19Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Obubu-ọnu nke ọnwa nke-anọ, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-ise, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-asa, na obubu-ọnu nke ọnwa nke-iri, gāghọrọ ulo Juda obi-utọ na ọṅù, na mb͕e akara àkà di nma; hu-kwa-nu ezi-okwu na udo n'anya.

20Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ọ gēru kwa ọzọ na ndi di iche iche na ndi bi n'ọtutu obodo gābia:

21ndi bi n'otù obodo gējekuru kwa obodo ọzọ, si, Ka ayi jisie ike je ime ka iru Jehova dajua, na ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha: m'gēje, ọbuná mu onwem.

22E, ọtutu ndi di iche iche na mba di iche iche di ike gābia ichọ Jehova nke usu nile nke ndi-agha nime Jerusalem, na ime ka iru Jehova dajua.

23Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Na mb͕e ahu ka ndikom iri gēsi n'asusu nile nke mba nile jide, ọbuná ijide ọnu-ọnu-ala uwe nwoke bu onye-Ju, si, Ayi na unu gāyikọ je, n'ihi na ayi anuwo na Chineke nọyere unu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help