ABÙ ỌMA 32 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke Devid. Maschil.

1Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye ebupuworo njehie-ya, onye ekpuchiworo nmehie-ya.

2Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú madu nke Jehova nādighi-aguru ya ajọ omume,

Bú onye ọ dighi aghughọ ọ bula di na mọ-ya.

3Mb͕e m'b͕ara nkiti, ọkpukpum nile kara nká

Site n'ọb͕ub͕ọ-ujam ogologo ubọchi nile.

4N'ihi na ehihie na abali aka-Gi di arọ̀ n'arum:

Umem b͕anwere n'ihe-ikpọ-nku nke uguru. Selah

5Anamemeri ka I mara nmehiem, ekpuchighkwam ajọ omumem:

M'siri, M'gēkwuputara Jehova njehiem nile;

Gi onwe-Gi bupu-kwa-ra ajọ omume nke nmehiem. Selah

6N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi:

N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.

7Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu;

Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah

8M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya:

M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.

9Unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule, nke ọ dighi nghọta ha nwere:

Agēji kwa bit na bridle, dika ihe-ekike, ijide ha,

Ma emeghi otú a ha agaghi-abiaru nso gi.

10Ọtutu ihe-nb͕u gādiri onye nēmebi iwu:

Ma onye nātukwasi obi na Jehova, ebere gādi ya buruburu.

11Ṅurianu ọṅu na Jehova, teghari-kwa-nu egwú ọṅù, unu ndi ezi omume:

Ti-kwa-nu nkpu ọṅù, unu nile ndi ziri ezi n'obi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help