ABÙ ỌMA 98 - Bible Lgbo

Abù Ọma.

1Bùkuenu Jehova abù ọhu;

N'ihi na Ọ luwo oké ọlu di iche iche;

Aka-nri-Ya na ogwe-aka-Ya di nsọ enyewo Ya nzọputa.

2Jehova emewo ka amara nzọputa-Ya:

N'anya mba nile ka O kpugheworo ezi omume-Ya.

3O chetawo ebere-Ya na ikwesi-ntukwasi-obi-Ya n'ebe ulo Israel di:

Nsọtu nile nke uwa ahuwo nzọputa Chineke-ayi.

4Tikusienu Jehova nkpu ọṅù ike, uwa nile:

Tiwanu nkpu, tienu nkpu ọṅù, bùanu abù ọma.

5Werenu ubọ-akwara bùkue Jehova abù ọma;

Werenu ubọ-akwara na olu abù ọma.

6Chirinu opì na olu opì-ike

Tisie nkpu ọṅù ike n'iru Eze, bù Jehova.

7Ka oké osimiri bib͕ọ, na ùjú-ya;

Elu-uwa dum madu bi, na ndi bi nime ya;

8Ka osimiri nile kua aka-ha;

Ka ugwu tie nkpu ọṅù n'otù;

9N'iru Jehova, n'ihi na Ọ biawo ikpe uwa ikpe:

Ọ gēwere ezi omume kpe elu-uwa dum madu bi ikpe,

Ọ gēwere kwa izi-ezi kpe ndi nile di iche iche.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help