JOB 29 - Bible Lgbo

1Job we malite itu ilu-ya ọzọ, si,

2Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na adim dika m'si di n'ọnwa gara aga,

Dika n'ubọchi nile mb͕e Chineke nēdebem;

3Mb͕e o nēnwu n'elu isim, bú oriọna-Ya,

Ìhè-Ya ka m'nēji eje ije n'ọchichiri;

4Otú m'diri n'ubọchi ihe nāgaram nke-ọma,

Mb͕e ìzù nzuzo Chineke dikwasi ulo-ikwūm;

5Mb͕e Onye puru ime ihe nile nānọyerem,

Mb͕e umu-ntakirim nọrom buruburu;

6Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile,

Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!

7Mb͕e m'puru je rue ọnu-uzọ-ama n'akuku obodo,

Mb͕e m'nēdozi ebe-ọnọdum n'amá,

8Umu-okorọbia hurum, zobe onwe-ha,

Ndi kara nká biliri, guzo;

9Ndi-isi kwubìri okwu nile ha,

Tukwasi ọbu-aka-ha n'ọnu-ha;

10Anubìri olu ndi-ndú,

Ire-ha rapa-kwa-ra n'okpo-ọnu-ha;

11N'ihi na nti nurum, we kpọm onye ihe nāgara nke-ọma;

Anya hu-kwa-ram, we b͕aram àmà:

12N'ihi na m'mere onye ewedara n'ala nke nētikum ka o wepuga onwe-ya,

Ya na nwa-nb͕ei, bú onye nēnweghi onye nēyere ya aka.

13Ngọzi nke onye nāla n'iyì nābiakwasim:

M'nēme kwa obi nwayi di-ya nwuru ka o tie nkpu ọṅù.

14Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:

Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.

15Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ,

Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.

16Nna ka m'buru ndi-ob͕eye:

Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.

17M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,

Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.

18M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,

Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:

19Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di,

Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:

20Nsọpurum di ọhu nimem,

Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.

21Mu ka madu gere nti, we chere,

Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.

22Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;

Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.

23Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo;

Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.

24M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere;

Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.

25M'nārọputa uzọ-ha, nọdu kwa ka onye-isi,

Biri kwa dika eze si ebi n'usu-ya,

Dika onye nākasi ndi nēru újú obi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help