DEUTERONOMI 2 - Bible Lgbo

1Ayi we che iru, bulie ije ba n'ọzara n'uzọ Oké Osimiri Uhie, dika Jehova gwaram okwu: ayi we je ugwu Sia buruburu ọtutu ubọchi.

2Jehova we gwam okwu, si,

3O zuworo unu, bú ije ugwu a buruburu: chenu iru n'Ugwu n'onwe-unu.

4Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:

5unu alusola ha ọ̀gù; n'ihi na M'gaghi-enye unu ala sitere n'ala-ha, ọbuná rue ebe nzọkwasi ọbu-ukwu-unu: n'ihi na ọ bu Isọ ka M'nyeworo ugwu Sia, ka ọ buru ihe-nnweta.

6Unu gēwere ego zuru ihe-oriri n'aka-ha, ka unu we rie; ọzọ kwa, unu gēwere ego zuru miri n'aka-ha, ka unu we ṅua.

7N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, agọziwo gi n'omume aka-gi nile: Ọ mawo ije-ije-gi n'ọzara uku a: ọgu arọ abua ndia ka Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi; ọ dighi ihe kọrọ gi.

8Ayi we si n'ala umu-nne-ayi, bú umu Isọ, ndi bi na Sia, gabiga, site n'uzọ Araba, site n'Ilat, site kwa n'Ezion-geba.

Ayi we che iru, gabiga n'uzọ ọzara Moab.

9Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta.

10(Imim biri nime ya na mb͕e gara aga, ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak;

11Refaim ka anāgu kwa ndia, dika ndi Anak; ma ndi Moab nākpọ ha Imim.

12Ọ bu kwa na Sia ka ndi Hoa bi na mb͕e gara aga, ma umu Isọ napuru ha ala-ha; ha we kpochapu ha n'iru ha, bichie n'ọnọdu ha; dika umu Israel mere ala nke ihe-nnweta-ya, nke Jehova nyere ha.)

13Ub͕u a, bilienu, gabiga miri-iyi Zered n'onwe-unu. Ayi we gabiga miri-iyi Zered.

14Ubọchi nile nke ayi siri na Kedesh-banea je ije, rue mb͕e ayi gabigara miri-iyi Zered, di orú arọ na iri na asatọ; rue mb͕e ọb͕ọ nile nke ndikom agha si n'etiti ọmuma-ulo-ikwū gwusia, dika Jehova ṅuru ha iyi.

15Ọzọ kwa, aka Jehova digidere ha, ikpochapu ha n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, rue mb͕e emere ka ha gwusia.

16Ọ we rue, mb͕e ndikom agha ahu nile nwupusiri n'etiti ndi Israel,

17na Jehova gwaram okwu, si,

18Gi onwe-gi nāgabiga ya, bu ókè-ala Moab, ta:

19ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta.

20(Ala Refaim ka agu-kwa-ra nke ahu: Refaim biri nime ya na mb͕e gara aga; ma ndi Amon nākpọ ha Zamzumim;

21ndi di uku, di kwa ọtutu, di kwa ogologo, dika ndi Anak; ma Jehova kpochapuru ha n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha:

22dika ihe O mere nye umu Isọ, ndi bi na Sia, mb͕e o kpochapuru ndi Hoa n'iru ha; ha we napu ha ala-ha, bichie n'ọnọdu ha rue ta:

23ma Avim ndi bi n'obodo ntà rue Geza, Kaftorim, ndi si na Kaftoa puta, kpochapuru ha, bichie n'ọnọdu ha.)

24Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha:

25Ta ka M'gāmalite itiyekwasi ujọ-gi na egwu-gi n'iru ndi nile n'okpuru elu-igwe nile, ndi gānu akukọ-gi, ma kwa jijiji, ọ gēb͕u kwa ha nb͕u n'ihi unu.

26M'we si n'ọzara Kedimot zigara Saihon, bú eze Heshbon, ndi-ozi izì okwu udo, si,

27Ka m'gabiga n'ala-gi: n'uzọ n'uzọ ka m'ganēje, m'gaghi-ewezuga onwem n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.

28N'ego ka i gērenyem ihe-oriri, ka m'we rie; n'ego ka i gēnyekwam miri, ka m'we ṅua: nání kwe ka m'gabiga n'ukwum;

29dika umu Isọ ndi bi na Sia, na ndi Moab ndi bi na ya merem; rue mb͕e m'gāgabiga Jọdan, ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-ayi, nēnye ayi.

30Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.

31Jehova we sim, Le, amalitewom irara Saihon na ala-ya nye n'iru gi: malite inweta, ka i we nweta ala-ya.

32Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz.

33Jehova, bú Chineke-ayi, we rara ya nye n'iru ayi, ayi we tib͕ue ya, na umu-ya ndikom, na ndi-ya nile.

34Ayi we were obodo-ya nile na mb͕e ahu, wezuga obodo ndikom ọ bula, ya na ndinyom na umu-ntakiri, ka ebibie ha; ọ dighi onye fọduru ayi rapuru:

35nání anu-ulo ka ayi lutara n'agha n'onwe-ayi, ha na ihe-nkwata obodo nile nke ayi were.

36Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi:

37nání, i biarughi nso ala umu Amon; akuku nile nke miri-iyi Jabok, na obodo nile nke ugwu, na ebe ọ bula Jehova, bú Chineke-ayi, nyere ayi iwu bayere ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help