I. SAMUEL 24 - Bible Lgbo

1O rue, mb͕e Sọl siri n'iso ndi Filistia lata, na egosiri ya, si, Le, Devid nọ n'ọzara En-gedi.

2Sọl we chiri nnù ndikom asa na ọgu iri arọputara n'Israel nile, ọ je ichọ Devid na ndikom-ya n'elu oké nkume nke ewu-ọhia.

3Ọ biarue ogige ìgwè ewu na aturu n'uzọ, ọb͕à di kwa n'ebe ahu; Sọl we ba ikpuchi ukwu-ya. Ma Devid na ndikom-ya nānọdu n'akuku ime ọb͕à ahu.

4Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.

5O rue, ka emesiri, na obi Devid tara ya uta, n'ihi na o bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda Sọl nwere.

6Ọ si ndikom-ya, Ya burum ihe-árú site na Jehova; m'gaghi-eme onye-nwem, bú onye Jehova etere manu, ihe a ma-ọli, bú iseti akam megide ya, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

7Devid we were okwu ndia b͕ochie ndikom-ya, o kweghi kwa ka ha bilie imegide Sọl. Sọl we si n'ọb͕à ahu bilie, je ije-ya.

8Devid we bilie ka emesiri, si n'ọb͕à ahu pua, kpọ òkù n'azu Sọl, si, Onye-nwem eze. Sọl we legide anya n'azu-ya, Devid we rube iru-ya n'ala, kpọ isi ala.

9Devid we si Sọl, N'ìhi gini ka i nēge nti okwu madu, si, Le, Devid nāchọ imejọ gi?

10Le, ubọchi ta ka anya-gi abua huworo otú Jehova nyere gi n'akam ta n'ọb͕à: ewe si ka m'b͕ue gi: ma anyam mere gi ebere; m'we si, M'gaghi-eseti akam megide onye-nwem, n'ihi na onye Jehova etere manu ka ọ bu.

11Ma, nnam, le, e, le ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi n'akam: n'ihi na nime nbipu m'bipuru ọnu-ọnu uwe-nwuda-gi, ma eb͕ughm i, gi mara hu kwa na ọ dighi ihe ọjọ ma-ọbu njehie di n'akam, emehieghkwam megide gi; ma gi onwe-gi nāchu ntá nkpuru-obim iwere ya.

12Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

13Dika ilu ndi mb͕e mbu nāsi, Na ndi nēmebi iwu ka nmebi-iwu si aputa: ma akam agaghi-adi n'aru gi.

14Ònye ka eze Israel putaworo iso n'azu? ònye ka i nāchu n'azu? ọ bu n'azu nkita nwuru anwu, n'azu otù igwu.

15Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi.

16O rue, mb͕e Devid gwabìri Sọl okwu ndia, na Sọl siri, Ọ̀ bu olu-gi, bú nka, nwam Devid? Sọl we welie olu-ya, kwa ákwá.

17Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.

18Gi onwe-gi egosiwo ta na i mewo ezi ihe n'ebe m'nọ: n'ihi na mb͕e Jehova mechibidorom nye n'aka-gi, i b͕ughm.

19Ma mb͕e madu gāchọta onye-iro-ya, ò gēzilaga kwa ya n'ezi uzọ? Jehova kwughachi kwa gi ezi ihe n'ọnọdu ihe a i meworom ta.

20Ma ub͕u a, le, amawom na i ghaghi ibu eze, na agēme kwa ka ala-eze Israel guzosie ike n'aka-gi.

21Ma ub͕u a were Jehova ṅuaram iyi, na i gaghi-ebipu nkpurum gānọchim n'azu, na i gaghi-ekpochapu aham n'ulo nnam.

22Devid we ṅuara Sọl iyi. Sọl we laghachi; ma Devid na ndikom-ya rigoro n'ebe ahu ewusiri ike.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help