AISAIA 57 - Bible Lgbo

1Onye ezi omume nāla n'iyì, ma ọ dighi onye ọ bula nētiye ya n'obi-ya; anēkpochapu kwa ndi-ebere, mb͕e ọ nādighi onye nāghọta na ekpochapuworo onye ezi omume n'iru ihe ọjọ.

2Ọ nābà n'udo; ha nēzu ike n'elu ihe-ndina-ya, onye ọ bula nke nāgazi agazi.

3Ma unu onwe-unu, biaruenu nso ebe a, unu umu-ndikom nke nwanyi ji igwe-oji atu isi ọma na isi ọjọ, unu nkpuru nke nwoke nākwa iko na nwanyi nākwa iko.

4Ònye ka ọ nātọ unu utọ imegide? ònye ka unu nāsaghepu ọnu mbara, riputasi kwa ire, imegide? ùnu onwe-unu abughi umu njehie, nkpuru okwu-ugha,

5unu ndi nēme onwe-unu ka unu di ọku n'etiti osisi terebinth, n'okpuru osisi ndu ọ bula; ndi nēb͕u umu-unu na ndagwurugwu nile n'okpuru nb͕awa nke nkume nile di elu?

6N'etiti nkume kwọrọ murumuru nke miri-iyi ka òkè-gi di; ha onwe-ha, ha onwe-ha bu ihe ruru gi n'ife-nzà: ọ bu kwa ha ka i wusiworo àjà-ihe-ọṅuṅu nye, sure kwa àjà-nsure-ọku, bú onyinye-inata-iru-ọma. Àgākasim obi bayere ihe ndia?

7N'elu ugwu di elu, nke eme-kwa-ra ka ọ di elu, ka i doworo ihe-ndina-gi: ọ bu kwa n'ebe ahu ka i rigoro ichu àjà.

8Ọ bu kwa n'azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n'ihi na mb͕e M'nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n'anya; aka-ha ka i huru.

9I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.

10N'iba-uba nke uzọ-gi ka ike gwusiri gi; i sighi, Ntukwasi-obi adigh: ndu aka-gi ka i chọtara; n'ihi ya i riaghi ọria.

11Ma ònye ka i cheb͕uworo onwe-gi bayere ya, we tua egwu ya, na i nēkwu okwu-ugha, we ghara ichetam, ghara kwa itiye ya n'obi-gi? Mù onwem adighi-ab͕a nkiti ọbuná site na mb͕e ebighi-ebi gara aga, i we ghara itu egwum?

12Mu onwem gēgosi ezi omume-gi; ma ọlu-gi nile, ha agaghi-abara gi urù.

13Mb͕e i nēti nkpu, ka ndi i chikọtaworo naputa gi; ma ha nile ka ifufe gēfepu, otù nku-ume gēkupu ha: ma onye ahu nke nab͕abà nimem gēketa ala, nweta kwa ugwu nsọm.

14Ọ gāsi kwa, Tulienu, tulienu, dozienu uzọ, bupunu ihe-isu-ngọngọ n'uzọ ndim.

15N'ihi na otú a ka Ọ siri, bú Onye di elu, Nke eme-kwa-ra ka Ọ di elu, Onye nēbi ebi mb͕e nile ebighi-ebi, Onye Nsọ ka aha-Ya bu kwa: Ọ si, N'ebe di elu di kwa nsọ ka M'bi, M'biye-kwa-ra onye mọ-ya bu ihe azọpiara azọpia di kwa ala, ime ka mọ nke ndi di ume-ala n'obi di ndu, na ime ka obi nke ndi azọpiara azọpia nime mọ-ha di ndu.

16N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.

17N'ihi ajọ omume nke urù-ya ka M'were iwe, we tie ya ihe, nēzobe irum nēwe kwa iwe: o we nāga nēchighari azu n'uzọ nke obi-ya.

18Uzọ-ya nile ka M'huworo, M'gēme kwa ka aru di ya ike: M'gēdu kwa ya, nyeghachi ya nkasi-obi nile, nyeghachi kwa ndi-ya nēru újú.

19Anamekè nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu abua: Udo, udo, diri onye nọ n'ebe di anya, di-kwa-ra onye nọ nso, ka Jehova siri; M'gēme kwa ka aru di ya ike.

20Ma ndi nēmebi iwu di ka oké osimiri nke nāmaghari amaghari: n'ihi na ọ pughi idi jū, miri-ya nāmaputa kwa urọ na apiti.

21Ọ dighi udo ndi nēmebi iwu nwere, ka Chinekem siri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help