1Chineke, were aha-Gi zọputam,
Were kwa idi-ike-Gi kpem ikpe.
2Chineke, nuru ekperem;
Ṅa nti n'okwu nile nke ọnum.
3N'ihi na ndi ala ọzọ ebiliwo imegidem,
Ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim:
Ha edoghi Chineke n'iru ha. Selah
4Le, Chineke bu onye nēyerem aka:
Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ndi nākwagide nkpuru-obim.
5Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha:
Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.
6M'gēji onyinye-afọ-ofufo churu Gi àjà:
M'gēkele aha-Gi, Jehova, n'ihi na ọ di nma.
7N'ihi na ọ bu na nkpab͕u nile ka Ọ naputaworom;
Anyam elekwasiwo kwa ndi-irom.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.