ABÙ ỌMA 12 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; n'elu Octave. Abù Ọma Devid.

1Jehova, zọputa; n'ihi na onye-ebere agwusiwo;

N'ihi na ndi kwesiri ntukwasi-obi agwupuwo n'etiti umu madu.

2Ihe-efu ka ha nēkwurita, otù onye na ibe-ya:

Eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwu okwu ire-utọ na obi abua ka ha ji ekwu.

3Ka Jehova bipu eb͕ub͕ere-ọnu nile nke nekwu okwu ire-utọ,

Na ire nke nēkwu oké ihe:

4Ndi siworo, Ayi nēme ire-ayi ka ọ di ike;

Eb͕ub͕ere-ọnu-ayi di n'akuku ayi: ònye ka ayi nwere dika onye-nwe-ayi?

5N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye,

Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru;

M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.

6Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha;

Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala,

Nke esichaworo ub͕ò asa.

7Gi onwe-gi, Jehova, gēdebe ha,

I gēchezi ha ka ha pua n'aka ọb͕ọ a rue mb͕e ebighi-ebi.

8Ndi nēmebi iwu nējeghari buruburu,

Mb͕e anēbuli ihe jọb͕uru onwe-ya elu n'ebe umu madu nọ.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help