I. JỌN 2 - Bible Lgbo

1Umu-ntakirim, ihe ndia ka m'nēdegara unu n'akwukwọ, ka unu we ghara imehie. Ọ buru kwa na onye ọ bula emehie, ayi nwere otù Onye nēkwu ọnu ayi n'ebe Nna-ayi nọ, Ya bu Jisus Kraist, bú Onye ezi omume:

2Ya onwe-ya bu kwa ihe ijuru Chineke obi bayere nmehie nile ayi; ma Ọ bughi ihe ijuru Ya obi bayere nání nmehie nke ayi onwe-ayi, kama Ọ bu kwa ihe ijuru Ya obi bayere nmehie nke uwa dum;

3nime nka ka ayi ma-kwa-ra na ayi amawo Ya, ma ọ buru na ayi edebe ihe nile O nyere n'iwu.

4Onye, nāsi, Amawom Ya, ma ọ dighi-edebe ihe nile O nyere n'iwu, ọ bu onye-ugha, ezi-okwu adighi kwa nime onye ahu:

5ma onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihunanya Chineke zue okè n'ezie. Nime nka ka ayi mara na ayi nọ nime Ya:

6onye nāsi na ọ nānọgide nime Ya, o ji ugwọ ka ya onwe-ya nējeghari kwa dika Ya onwe-ya jeghariri.

7Ndi m'huru n'anya, ọ dighi ihe ọhuu enyere n'iwu nkem m'nēdegara unu, kama ihe ochie enyere n'iwu nke unu nwere site na mbu: ihe ochie ahu enyere n'iwu bu okwu ahu nke unu nuru.

8Ọzọ, ihe ọhu enyere n'iwu ka m'nēdegara unu, ya bu ihe nke bu ezi-okwu nime Ya na nime unu; n'ihi na ọchichiri ahu nāgabiga, ezi ìhè ahu nāmu kwa ub͕u a.

9Onye nāsi na ya nọ n'ìhè ahu, ma ọ nākpọ nwa-nna-ya asì, ọ nānọ n'ọchichiri ahu rue ub͕u a.

10Onye nāhu nwa-nna-ya n'anya nānọgide n'ìhè ahu, ọ dighi ihe nēme ka madu ma n'onyà di nime ya.

11Ma onye nākpọ nwa-nna-ya asì nọ n'ọchichiri ahu, nējeghari kwa nime ọchichiri ahu, ọ mataghi kwa ebe ọ nāga, n'ihi na ọchichiri ahu mere ka anya-ya kpue ìsì.

12Umu-ntakirim, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na agbagharawo unu nmehie-unu n'ihi aha-Ya.

13Ndi bu nna, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu Nke di site na mbu. Umu-okorọbia, anamedegara unu akwukwọ, n'ihi na unu emeriwo ajọ onye ahu. Umu-ntakirim, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Nna-ayi.

14Ndi bu nna, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu amawo Onye ahu nke di site na mbu. Umu-okorọbia, edegaram unu akwukwọ, n'ihi na unu di ike, okwu Chineke nānọgide kwa nime unu, unu emeriwo kwa ajọ onye ahu.

15Unu ahula uwa, ma-ọbu ihe nke di n'uwa, n'anya. Ọ buru na onye ọ bula ahú uwa n'anya, ihu-n'anya nke Nna-ayi adighi nime ya.

16N'ihi na ihe nile nke di n'uwa, bú agu ihe ọjọ nke anu-aru, na agu ihe ọjọ nke anya, na oké-okwu nke ibi-obi, esiteghi na Nna-ayi, kama o sitere n'uwa.

17Uwa nāgabiga kwa, ya na agu ihe ọjọ ya: ma onye nēme ihe Chineke nāchọ nānọgide rue mb͕e ebighi-ebi.

18Umu-ntakirim, ọ bu oge hour ikpe-azu: dika unu nukwara na otù onye nke nēmegide Kraist nābia, ọbuná ub͕u a ọtutu ndi nēmegide Kraist aputawo; nke ayi sitere na ya mara na ọ bu oge hour ikpe-azu.

19Ha siri n'etiti ayi pua, ma ha abughi ndi nke ayi; n'ihi na asi na ha bu ndi nke ayi, ha gānọgidewori n'etiti ayi: ma ha puru, ka ewe me ka ha puta ìhè na ha nile bu ndi nābughi ndi nke ayi.

20Unu onwe-unu nwe-kwa-ra otite-manu site n'Onye Nsọ ahu, unu mata-kwa-ra ihe nile.

21Ọ bughi n'ihi na unu amataghi ezi okwu ahu ka m'degara unu akwukwọ, kama ọ bu n'ihi na unu matara ya, ọ bu kwa n'ihi na ọ dighi ugha ọ bula si n'ezi-okwu ahu puta.

22Onye bu onye-ugha ahu ma-ọbughi onye nāgọ si na Jisus abughi Kraist ahu? Onye nāgọnari Nna-ayi na Ọkpara-Ya, onye a bu onye ahu nēmegide Kraist.

23Onye ọ bula nke nāgọnari Ọkpara ahu, o nweghi kwa Nna ahu: onye nēkwuputa Ọkpara ahu, o nwe-kwa-ra Nna ahu.

24Ma unu onwe-unu, ka ihe ahu unu nuru site na mbu digide nime unu. Ọ buru na ihe ahu unu nuru site na mbu adigide nime unu, unu onwe-unu gānọgide kwa nime Ọkpara ahu, nọgide kwa nime Nna-Ya.

25Nka bu kwa nkwa ahu nke Ya onwe-ya kwere ayi, bú ndu ahu, nke bu ndu ebighi-ebi.

26Ihe ndia ka m'degara unu n'akwukwọ bayere ndi nēduhie unu.

27Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n'aka-Ya nādigide nime unu, ọ dighi kwa unu nkpà ka onye ọ bula zí unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzí unu ihe bayere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābughi kwa okwu-ugha, dika O zíkwara unu, nānọgidenu nime Ya.

28Umu-ntakirim, nānọgide-kwa-nu nime Ya ub͕u a; ka ọ gābu, ma ọ buru na agēme ka Ọ puta ìhè, ka ayi we nwe nkwuwa-okwu, ghara kwa iwere ihere pua n'iru Ya n'ọbibia-Ya.

29Ọ buru na unu matara na Ọ bu onye ezi omume, unu mara na onye ọ bula nke nēme ezi omume bu kwa onye amuworo site na Ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help