JEREMAIA 46 - Bible Lgbo

1Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere mba nile.

2Nke diri Ijipt: bayere usu-ndi-agha nke Fero-neko, bú eze Ijipt, nke di n'akuku osimiri Yufretis nime Kakemish, nke Nebukadreza, bú eze Babilon, tib͕uru n'arọ nke-anọ nke Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda.

3Donu ọta na ọta uku n'usoro, biaru-kwa-nu nso ibu agha.

4Kegidenu inyinya n'ub͕ọ-ala, rikwasinu, unu ndi-inyinya, guzo-kwa-nu onwe-unu nēkpu okpu-agha; richanu ube-unu, yirinu uwe-agha-unu.

5Gini mere m'huworo ya? ndi ahu nātu ujọ b͕aghachi azu; anētipia kwa ndi-dike-ya, ha ab͕alagawo kwa ngwa ngwa, we ghara ile anya n'azu: egwu di buruburu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

6Ka onye nwere ukwu ọsọ ghara ib͕alaga, ka dike ghara kwa iwepuga onwe-ya; n'Ugwu n'akuku osimiri Yufretis ka ha suru ngọngọ, da.

7Ònye bu onye a? dika osimiri Nail ka ọ nērú, dika osimiri ka miri-ya nile nāmaghari.

8Ijipt nērú dika osimiri Nail, ọ bu kwa dika osimiri ka miri-ya n'amaghari: o we si, M'gārigo, kpuchie uwa; m'gēme ka obodo na ndi bi nime ya la n'iyì.

9Rigonu, unu inyinya; kpọtuanu nkpọtu, unu ub͕ọ-ala; ka ndi-dike puta kwa: Kush na Put, ndi nēji ọta; na Ludim, ndi nēji nāzọ kwa uta ukwu ikwe ya.

10Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.

11Rigorue Gilead, nara balm, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Ijipt: n'efu ka i meworo ka ọgwu ba uba; ọ dighi ọgwu-ntechi i nwere.

12Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua.

13Okwu ahu nke Jehova gwara Jeremaia, bú onye-amuma, bayere ọbibia nke Nebukadreza, bú eze Babilon, itib͕u ala Ijipt.

14Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.

15Gini mere eji zachapu onye nke gi di ebube? o guzoghi, n'ihi na Jehova kwaturu ya.

16O mere ka ndi nāsu ngọngọ di ọtutu, e, otù onye dakwasiri ibe-ya: ha we si, Bilie, ka ayi laghachikuru ndi-ayi, laghachi kwa n'ala amuru ayi, pua n'iru mma-agha nēme ihe-ike.

17Ha kpọrọ nkpu n'ebe ahu, si, Fero, bú eze Ijipt, bu nání nkpọtu; o kwerewo ka mb͕e akara àkà gabiga.

18Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya), n'ezie dika Teboa n'etiti ugwu nile, na dika Kamel n'akuku oké osimiri, otú a ka ọ gābia.

19Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n'ala ọzọ, gi ada nēbi n'Ijipt: n'ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.

20Nwa-ab͕ọghọ-ehi mara nma nke-uku ka Ijipt bu; odudo nke sitere n'Ugwu abiawo, ọ biawo.

21Ọzọ, ndi-ya egoro agha ndi nọ n'etiti ya di ka umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba; n'ihi na ha onwe-ha elewo anya n'azu, ha ab͕alagawo n'otù, ha eguzogh: n'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha abiakwasiwo ha, bú mb͕e nleta-ha.

22Olu-ya di ka mkpatu agwọ mb͕e ọ nāga; n'ihi na ha gāchiri usu-ndi-agha je ije, ha achiriwo kwa anyu-ike biakute ya, dika ndi-ọwa-nkú.

23Ha gēb͕utu oké ọhia-ya, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na agaghi-eleputa ya; n'ihi na ha di ọtutu kari igurube, ha adighi kwa ọnu-ọgugu.

24Agēme ka ihere me ada Ijipt; agēnye ya n'aka ndi Ugwu.

25Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:

26M'gēnye kwa ha n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

27Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.

28Gi onwe-gi atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); n'ihi na gi ka M'nọyere: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chugaworo gi, ma gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help