ABÙ ỌMA 137 - Bible Lgbo

1N'akuku osimiri nile nke Babilon,

N'ebe ahu ka ayi nọduru ala, e, ayi kwara ákwá,

Mb͕e ayi chetara Zaion.

2N'osisi willow di n'etiti ya

Ka ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.

3N'ihi na n'ebe ahu ka ndi nādọta ayi n'agha riọro n'aka-ayi okwu abù,

Ndi lutara ihe-ayi n'agha riọ-kwa-ra ayi ka ayi ṅuria ọṅu, si,

Bùaranu ayi otù nime abù Zaion.

4Àyi gēsi aṅa bù abù Jehova

N'ala nke onye ala ọzọ?

5Ọ buru na echezọm i, Jerusalem,

Ka aka-nrim chezọ ǹkà-ya.

6Ka irem rapara n'okpo-ọnum,

Ma ọ buru na adighm-echeta gi;

Ma ọ buru na adighm-eme ka Jerusalem di elu

N'elu isi ọṅùm.

7Jehova, cheta ubọchi Jerusalem

Megide umu Edom;

Ndi nāsi, B͕abanu ya ọtọ, b͕abanu ya ọtọ,

Rue ntọ-ala di nime ya.

8Gi ada Babilon, nke bu onye anāpunara ihe;

Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gākwughachi gi

Nmeso-gi nke i mesoworo ayi.

9Onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bú onye gāchiri umu-gi nāṅu ara tupia ha

Na nkume di elu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help