JOSHUA 14 - Bible Lgbo

1Ma ndi bu ihe nke umu Israel ketara n'ala Kenean, ndi Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na Joshua nwa Nun, na ndi-isi ulo nke ndi bu nna nke ebo nile nke umu Israel, mere ka ha keta;

2n'ifè-nzà ka ihe-nketa-ha di, dika Jehova nyere iwu n'aka Moses, bayere ebo iteghete ahu, baye-kwa-ra nkera ebo ahu.

3N'ihi na Moses nyere ihe-nketa nke ebo abua na nkera ebo ahu n'ofè Jọdan: ma o nyeghi ndi Livai ihe-nketa n'etiti ha.

4N'ihi na umu Josef bu ebo abua, bú Manase na Efraim: ha enyeghi kwa ndi Livai òkè n'ala ahu, ma-ọbughi obodo ufọdu ibi obi, ha na ebe-ita-nri-ha nke diri anu-ulo-ha na àkù ha kpatara.

5Dika Jehova nyere Moses iwu, otú a ka umu Israel mere, ha we kè ala ahu.

6Umu Juda we biarue nso Joshua nime Gilgal: Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, we si ya, Gi onwe-gi amawo okwu Jehova gwara Moses, bú onye nke Chineke, bayerem, baye-kwa-ra gi, nime Kedesh-banea.

7Ọgu arọ abua ka m'b͕ara mb͕e Moses, bú orù Jehova, si na Kedesh-banea zipum iledo ala nka; m'we weghachiri ya okwu dika o si di n'obim.

8Ma umu-nnem ndi mu na ha rigoro mereka obi lọ ndi Israel miri: ma mu onwem sozuru Jehova, bú Chinekem, n'azu.

9Moses we ṅua iyi n'ubọchi ahu, si, Ala nke i zọkwasiri ukwu aghaghi iburu gi na umu-gi ihe-nketa rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na i sozuwo Jehova, bú Chinekem, n'azu.

10Ma ub͕u a, le, Jehova emewo ka m'di ndu, dika O kwuru, ọgu arọ abua na ise ndia, site na mb͕e Jehova gwara Moses okwu a, mb͕e Israel jere ije n'ọzara: ma ub͕u a, le, mu onwem b͕ara ọgu arọ anọ na ise ta.

11Rue ub͕u a m'di ike ta dika m'di n'ubọchi Moses zigaram: dika ikem si di mb͕e ahu, otú a ka ikem di kwa ub͕u a, ibu agha, na ipu apu, na ibata abata.

12Ma ub͕u a, nyem ugwu a, nke Jehova kwuru okwu bayere ya n'ubọchi ahu; n'ihi na i nuru n'ubọchi ahu na ndi Anak nọ n'ebe ahu, na obodo di uku nke ewusiri ike: eleghi anya Jehova gānọyerem, m'gānapu kwa ha ala-ha, dika Jehova kwuru.

13Joshua we gọzie ya; ọ we nye Keleb nwa Jefune Hebron ibu ihe-nketa.

14N'ihi nka Hebron we ghọrọ Keleb nwa Jefune, bú onye-Kenizait, ihe-nketa, rue ta; n'ihi na o sozuru Jehova, bú Chineke Israel, n'azu.

15Ma aha Hebron na mb͕e gara aga bu Kiriat-aba; onye dikarisiri uku n'etiti ndi Anak ka Aba ahu bu. Ala ahụ we rapu ibu agha, di jū.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help