EMOS 1 - Bible Lgbo

1Okwu Emos, onye nọ n'etiti ndi-nche-anu-ulo nke Tekoa, nke ọ huru bayere Israel n'ubọchi Uzaia, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam nwa Joash, bú eze Israel, arọ abua tutu ala-ọma-jijiji.

2Ọ we si, Jehova gēsi na Zaion bib͕ọ, me ka olu-Ya si na Jerusalem da; ebe-ita-nri nile nke ndi-ọzùzù-aturu ewe ru újú, elu Kamel gākpọnwu kwa.

3Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Damaskọs, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha ewerewo ígwè eji azọcha ọka zọcha Gilead:

4ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.

5M'gētiji kwa nkpọrọ Damaskọs, si na ndagwurugwu Even bipu onye bi ya, si kwa n'ulo Eden bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze: agēme kwa ka ndi Siria je biri n'ala ọzọ, bú Kia; otú a ka Jehova siri.

6Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Geza, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mere ka otù ndi je biri n'ala ọzọ, ha nile, imechibido ha nye n'aka Edom:

7ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Geza, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile:

8M'gēsi kwa n'Ashdad bipu onye bi ya, si kwa n'Ashkelon bipu onye nējide nkpa-n'aka-eze; M'gēchighari kwa akam imegide Ekron, ndi Filistia ndi fọduru gāla kwa n'iyì; otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri.

9Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Taia, e, n'ihi anọ ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na ha mechibidoro otù ndi emere ka ha nile je biri n'ala ọzọ nye n'aka Edom, ha echetaghi kwa ọb͕ub͕a-ndu nke umu-nne:

10ma M'gēzite ọku n'elu mb͕idi Taia, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.

11Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Edom, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o jiri mma-agha chu nwa-nne-ya, o bibi-kwa-ra obi-ebere-ya nile, iwe-ya we nādọka rue mb͕e ebighi-ebi, ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya, o debewo ya mb͕e ebighi-ebi:

12ma M'gēzite ọku na Timan, o gēripia kwa ulo-elu nile nke Bọzra.

13Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke umu Amon, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi; n'ihi na ha ab͕awawo ndinyom Gilead di ime afọ ka ha we me ka ókè-ala-ha sa mbara:

14ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:

15eze-ha gāla kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ya onwe-ya na ndi-isi-ya n'otù; otú a ka Jehova siri.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help