I. NDI KỌRINT 4 - Bible Lgbo

1Ka madu nāgu ayi otú a, dika ndi nējere Kraist ozi, ndi bu kwa ndi nāchi èzí-na-ulo n'ihe-omimi nke Chineke.

2N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.

3Ma ọ burum ihe dikarisiri ntà ka unu, ma-ọbu ubọchi ikpé nke madu, kpem ikpé: é-è, ekpeghi m ọbuná onwem ikpé.

4N'ihi na ọ dighi ihe ọ bula m'mara megide onwem; ma ọ bughi na nka ka aguworom n'onye ezi omume: kama Onye nēkpem ikpé bu Onye-nwe-ayi.

5Ya mere, unu ekpela ihe ọ bula ikpé mb͕e oge ahu akērughi, rue mb͕e ọ bula Onye-nwe-ayi gābia, Onye gēweputa kwa ihe nile ezoro ezo nke ọchichiri n'ìhè, me kwa ka ìzù nile nke obi nile puta ìhè; mb͕e ahu ka madu nile n'otù n'otù gēnwe kwa otuto-ha site n'aka Chineke.

6Ma ihe ndia, umu-nnam, ka m'mere ka ha ghọ mu onwem na Apọlos n'oyiyi n'ihi unu; ka unu we muta nime ayi ozizì a, Unu agabigala ihe edeworo n'akwukwọ, ka unu we ghara ifuli onwe-unu elu, otù onye n'ihi otù onye megide madu-ibe-ya.

7N'ihi na Ònye nākpa ókè n'etiti gi na madu-ibe-gi? ọ̀ bu gini kwa ka i nwere nke i nānataghi? ma ọ buru na i natara ya, gini mere i nānya isi, dika agāsi na i nataghi ya?

8Ọbuná ub͕u a unu erijuwo afọ, ọbuná ub͕u a unu ghọrọ ọgaranya, unu buru eze mb͕e ayi onwe-ayi nānọghi ya: e, ọ gādim nọ̄ mma, ma asi na unu buru eze n'ezie, ka ayi onwe-ayi we so kwa unu buru eze.

9N'ihi na anamechè na Chineke were ayi, bú ndi-ozi, gosi, dika ndi-ikpe-azu, dika ndi amara ikpé ọnwu: n'ihi na emere ayi ihe-nkiri nye uwa na ndi-mọ-ozi na madu.

10Ayi onwe-ayi bu ndi-nzuzu n'ihi Kraist, ma unu onwe-unu bu ndi nwere uche nime Kraist; ayi onwe-ayi adighi ike, ma unu onwe-unu di ike; anēnye unu onwe-unu otuto, ma anēme ayi onwe-ayi ihe-ihere.

11We rue oge hour di ub͕u a agu nāgu ayi, akpiri nākpọ kwa ayi nku, ayi nāb͕a kwa ọtọ, anēti kwa ayi aka, ayi enweghi kwa ebe-obibi;

12ayi nādọb͕u kwa onwe-ayi n'ọlu, were aka-ayi nālu ọlu: mb͕e anēkwutọ ayi, ayi nāgọzi: mb͕e anēsob͕u ayi, ayi nānagide:

13mb͕e anēkwulu ayi, ayi nāriọ aririọ; emere ka ayi buru dika ihe asachapuru n'uwa, ihe ehichapuru n'ihe nile, rue ub͕u a.

14Edeghi m ihe ndia n'akwukwọ dika anameme unu ihe-ihere n'iru, kama dika anamadu unu ọdú, dika umum m'huru n'anya.

15N'ihi na asi na unu nwere orú nnù ndi-ozizí na nnù ndi-ozizí ise nime Kraist, ma unu enweghi ọtutu nna: n'ihi na mu onwem nime Kraist Jisus were ozi ọma mu unu.

16Ya mere ariọm unu, burunu ndi nēṅomim.

17N'ihi nka ka m'zitere unu Timọti, onye bu nwam nime Onye-nwe-ayi, buru kwa onye m'huru n'anya, onye kwesiri ntukwasi-obi, ọ gēchetara unu uzọm nile nke di nime Kraist, dika m'nēzí n'ebe nile na nzukọ Kraist nile ọ bula.

18Ma ufọdu fuliri onwe-ha elu, dika agāsi na m'gaghi-abiakute unu.

19Ma m'gābiakute unu ọsọsọ, ma ọ buru na Onye-nwe-ayi chọrọ; m'gāmara kwa, ọ bughi okwu nke ndi fuliworo onwe-ha, kama ike-ha.

20N'ihi na ala-eze Chineke adighi n'okwu-ọnu, kama n'ike.

21Gini ka unu nāchọ? ọ̀ bu utari ka m'gēwere biakute unu, ma-ọbu ihu-n'anya na mọ nke idi-nwayọ?

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help