ABÙ ỌMA 113 - Bible Lgbo

1Tonu Ja.

Tonu, unu ndi-orù Jehova,

Tonu aha Jehova.

2Ka aha Jehova buru ihe agọziri agọzi

Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.

3Site n'ọwuwa anyanwu rue ọdida-ya

Aha Jehova gābu ihe anēto eto.

4Jehova di elu n'elu mba nile,

N'elu elu-igwe ka ebube-Ya di.

5Ònye di ka Jehova, bú Chineke-ayi?

Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di elu inọdu ka eze,

6Nke nēme Onwe-ya ka Ọ di ala ilekwasi

Elu-igwe na ilekwasi uwa anya.

7Ọ bu onye nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,

O nēsi n'ebe ikpofu ahihia bulie ob͕eye elu;

8Ime ka ya na ndi amara aha nọkọ,

Ka ya na ndi amara aha-ha n'etiti ndi-ya nọkọ.

9Ọ bu onye nēme ka nwayi-àgà nke ulo biri n'ezi-na-ulo nke aka ya,

Buru nne nāṅuri ọṅu nke muworo umu-ndikom.

Tonu Jehova.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help