ABÙ ỌMA 130 - Bible Lgbo

Abú Nrigo.

1N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova.

2Onye-nwem, ge nti olum:

Ka nti-Gi nāṅa kwa nti

N'olu nke aririọ-amaram nile.

3Ọ buru na I riba ajọ omume nile ama, Ja,

Onye-nwe-ayi, ònye gēguzo?

4Ma n'aka-Gi ka nb͕aghara di,

Ka ewe tua egwu Gi.

5Elewom anya Jehova, nkpuru-obim elewo anya,

Ọ bu kwa okwu-Ya ka m'chereworo.

6Nkpuru-obim nēchere Jehova,

Karia ka ndi-nche si echere ututu;

E, karia ka ndi-nche si echere ututu.

7Israel, chere Jehova:

N'ihi na n'aka Jehova ka ebere di,

Nb͕aputa riri nne di kwa n'aka-Ya.

8Ya onwe-ya gāb͕aputa kwa Israel

N'ajọ omume-ya nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help