EKLISIASTIS 8 - Bible Lgbo

1Ònye di ka onye mara ihe? ònye nāma kwa akukọ-isi okwu? Amam-ihe madu nēnye iru-ya ìhè, ike nke iru-ya nāb͕anwe kwa.

2Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.

3Esila n'iru ya pua ọsọsọ; eguzola n'ihe ọjọ: n'ihi na ihe ọ bula nke nātọ ya utọ ka ọ nēme.

4N'ihi na okwu eze nwere ike; ònye gāsi kwa ya, Gini ka i nēme?

5Onye nēdebe ihe enyere n'iwu agaghi-ama ihe ọjọ; ọzọ, mb͕e na ikpé ka obi onye mara ihe nāmata.

6N'ihi na ihe ọ bula anēme eme nwere mb͕e na ikpé; n'ihi na ọnọdu ọjọ madu riri nne n'aru ya:

7n'ihi na ọ dighi-ama ihe gādi adi; n'ihi na ònye gēgosi ya otú ọ gādi?

8Ọ dighi madu ọ bula nwere ike n'aru mọ ib͕ochi mọ; ọ dighi kwa ike o nwere n'aru ubọchi ọnwu; ọ dighi kwa nzilaga di n'agha ahu: nmebi-iwu agaghi-eme ka onye-nwe-ya wepuga onwe-ya.

9Ihe nile a ka m'huworo, m'we nye obim ilu ọlu ọ bula nke aluworo n'okpuru anyanwu: mb͕e di mb͕e otù madu nwere ike n'aru madu-ibe-ya imejọ ya.

10N'uzọ di otú a m'hu-kwa-ra ndi nēmebi iwu ka elìri ha, ha we ba n'ílì; ha we si n'ebe nsọ la, ewe chezọ ha n'obodo ebe ha mere otú a: nka bu kwa ihe-efu.

11N'ihi na emeghi ihe ekpere n'ikpe megide ọlu ọjọ ọsọsọ, n'ihi nka obi umu madu juru eju nime ha ime ihe ọjọ.

12Asi na onye-nmehie eme ihe ọjọ ọgu ub͕ò ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n'ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n'iru Ya:

13ma ọ gaghi-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gaghi-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n'ihi na ọ dighi-atu egwu n'iru Chineke.

14Ihe-efu di nke anēme n'elu uwa; na ndi ezi omume di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi nēmebi iwu si di; ọzọ, ndi nēmebi iwu di, ndi ọ nādakwasi dika ọlu ndi ezi omume si di: m'siri na nka bu kwa ihe-efu.

15Mu onwem we ja ọṅù, n'ihi na ọ dighi ezi ihe madu nwere n'okpuru anyanwu ma-ọbughi iri ihe, na iṅu ihe-ọṅuṅu, na iṅuri ọṅu: n'ihi na nke ahu gārapara n'aru-ya nime ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu ubọchi nile nke ndu-ya nke Chineke nyeworo ya n'okpuru anyanwu.

16Mb͕e m'were obim nye ima amam-ihe, na ihu nweda-n'ala nke anēme n'elu uwa: (n'ihi na madu di kwa nke nādighi-ahu urá n'anya-ya abua ma ọ bu n'ehihie ma-ọbu n'abali:)

17m'we hu ọlu nile nke Chineke, na madu apughi ichọputa ọlu nke aluworo n'okpuru anyanwu: n'ihi na ọ buru na madu adọb͕u onwe-ya n'ọlu n'uzọ nile ichọ ya, ma ọ gaghi-achọputa ya; ọzọ kwa, ọ buru na onye mara ihe asi na ọ gāma ya, ọ pughi ichọputa ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help