MAK 3 - Bible Lgbo

1I bà-kwa-ra ọzọ n'ulo-nzukọ-ha; otù nwoke nọ kwa n'ebe ahu nke aka-ya kpọnwuru akpọnwu.

2Ha we nēche Ya, ma Ọ gēme ka aru-ya di ike n'ubọchi-izu-ike; ka ha we bo Ya ebubo.

3O we si nwoke ahu aka-ya kpọnwuru akpọnwu, Bilie, puta n'etiti.

4O we si ha, Ò ziri ezi n'iwu ime ezi ihe, ma-ọbu ime ihe ọjọ, n'ubọchi-izu-ike? ìzọputa ndu, ma-ọbu ib͕u eb͕u? Ma ha kpuchiri ọnu-ha.

5Mb͕e O lesiri ha anya gburugburu n'iwe, ebe ọ nēwuta Ya nke-uku, bú na anēme ka obi-ha ma etili, O we si nwoke ahu, Setipu aka-gi. O we setipu ya: ewe me ka aka-ya di ka ọ di mbu.

6Ndi-Farisi we pua, ngwa ngwa ha na ndi Herod we b͕a ìzù megide Ya, ka ha gēsi la Ya n'iyì.

7Jisus we wezuga Onwe-ya, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, je oké osimiri: oké ọtutu madu si na Galili soro: oké ọtutu madu si kwa na Judia,

8si kwa na Jerusalem, si kwa n'Aidumia, na ofè Jọdan, na buruburu Taia na Saidon, biakute Ya, mb͕e ha nuru ihe nile Ọ nēme, ka ha ra.

9O we gwa ndi nēso uzọ-Ya okwu, ka otù ub͕o ntà di nēche Ya n'ihi ìgwè madu ahu, ka ha ghara ikpab͕u Ya:

10n'ihi na O mereri ka aru ọtutu madu di ike; ya mere na ha dagidere Ya ka ha metu Ya aka, ka ha ra, bú ndi ajọ ọria di iche iche di n'aru.

11Ọzọ, mb͕e ọbula ndi-mọ nādighi ọcha lere Ya anya, ha nāda n'ala n'iru Ya, nēti nkpu, si, Gi onwe-gi bu Ọkpara Chineke.

12Ọ nābasi-kwa-ra ha nba ike, ka ha ghara ime ka Ọ puta ìhè.

13O we rigo n'ugwu ahu, kpọ ha biakute Ya, bú ndi Ya onwe-ya chọrọ: ha we jekuru Ya.

14O we me ndikom iri na abua, ka Ya na ha we biri, ka O we nēzipu kwa ha ikwusa ozi ọma,

15na inwe ike ichupu ndi-mọ ọjọ:

16Saimon ka O nyekwasiri aha Pita;

17na Jemes nwa Zebedi, na Jọn nwa-nne Jemes; ha ka O nyekwasiri aha Boanajis, nke bu, Umu éb͕è-elu-igwe:

18na Andru, na Filip, na Batọlọmiu, na Matiu, na Tomas, na Jemes nwa Alfiọs, na Tadiọs, na Saimon Kananaiọs,

19na Judas Iskariot, onye ra-kwa-ra Ya nye.

O we ba n'ulo.

20Ìgwè madu we b͕akọ ọzọ, ya mere na ha apughi ọbuná iri nri.

21Mb͕e ndi-ikwu-Ya nuru ya, ha we pua ijide Ya: n'ihi na ha nāsi, Anya adighi Ya nma.

22Ndi-ode-akwukwọ ndi si na Jerusalem ridata we si, O nwere Beelzebul; ha si kwa, N'ike onye-isi ndi-mọ ọjọ ka Ọ nāchupu ndi-mọ ọjọ.

23O we kpọ ha biakute Ya, si ha n'ilu di iche iche, Sètan Si aṅa pu ichupu Setan?

24Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.

25Ọ buru kwa na èzí-na-ulo ekewa megide onwe-ya, èzí-na-ulo ahu agaghi-apu iguzo.

26Ọ buru kwa na Setan ebiliwo megide onwe-ya, we kewa, ọ pughi iguzo, kama o nwere ọgwugwu.

27Ma ọ dighi onye ọ bula puru ibà n'ulo onye di ike, na ipunara ya ihe-ya nile, ma ọ buru na o bughi uzọ ke onye ahu di ike ab͕u; mb͕e ahu ọ gāpunara kwa ya ihe di n'ulo-ya.

28N'ezie asim unu, Na agāb͕aghara umu madu nmehie-ha nile, na nkwulu-ha, ka ha ra, bú nke ha gēji kwulu:

29ma onye ọ bula nke gēkwulu Mọ Nsọ enweghi nb͕aghara rue mb͕e ebighi-ebi, ma nmehie ebighi-ebi nātuhi ya:

30n'ihi na ha nāsi, O nwere mọ nādighi ọcha.

31Nne-Ya na umu-nne-Ya abia kwa; ha we guzo n'èzí, zigara Ya ozi, nākpọ Ya.

32Ìgwè madu nānọ kwa Ya buruburu; ha we si Ya, Le, nne-Gi na umu-nne-Gi nọ n'èzí nāchọ Gi.

33O we za ha, si, Ònye bu nnem na umu-nnem?

34Mb͕e O lesiri ha anya buruburu, bú ndi nọ Ya buruburu, Ọ si, Le, nnem na umu-nnem!

35N'ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke, na nwa-nnem nwanyi, na nnem.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help