NDI GALETIA 1 - Bible Lgbo

1Pọl, onye-ozi (ọ bughi site na madu, o siteghi kwa n'aka madu, kama o sitere n'aka Jisus Kraist, site kwa n'aka Chineke, bú Nna, Onye mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie),

2na umu-nna-ayi nile ndi mu na ha nọ, ayi nēdegara nzukọ Kraist nile nke Galetia akwukwọ:

3Amara diri unu na udo nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist puta.

4Onye nyere Onwe-ya n'ihi nmehie nile ayi, ka O weputa ayi n'ajọ oge nke di ub͕u a, dika ọchichọ nke Chineke, bú Nna-ayi, si di:

5Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.

6Ọ nējum anya na unu nēsi n'aka Onye kpọrọ unu n'amara Kraist b͕abiga ọsọsọ otú a n'ozi ọma di iche;

7nke nābughi ozi ọma ọzọ: ọ bu nání na ufọdu di ndi nēme ka obi lọ unu miri, ndi nāchọ kwa itughari ozi ọma Kraist.

8Ma asi kwa na ayi onwe-ayi, ma-ọbu mọ-ozi nke sitere n'elu-igwe, gēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi ozi ọma nke ayi zìri unu, ya buru anathema (onye mmegide).

9Dika ayi kwuworo n'oge gara aga, anamekwu kwa ya ub͕u a ọzọ, Ọ buru na onye ọ bula nēzì unu ozi ọma ọzọ tukwasi nke unu natara, ya buru anathema (onye mmegide).

10N'ihi na ọ̀ bu madu ka m'nēme ka ha kweye ub͕u a, ma-ọbu Chineke? ma-ọbu ànamachọ uzọ ime ihe gātọ madu utọ? ọ buru na anọm nēme ihe gātọ madu utọ, m'gaghi-abuwori orù nke Kraist.

11N'ihi na emem ka unu mara, umu-nnam, na ozi ọma m'zisara, na ọ bughi nke mmadu chèputara.

12N'ihi na mu onwem anataghi kwa ya site na madu, ọ dighi kwa onye zírim ya, kama a nuru m site na nkpughe nke Jisus Kraist.

13N'ihi na unu nuru ihe bayere ibi-obim n'oge gara aga n'uzọ ndi-Ju, na anamesob͕u nzukọ Chineke nke-uku ri nne, mebi kwa ya:

14anamaga-kwa-ri n'iru n'uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n'etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n'aka idebe.

15Ma mb͕e ọ di Chineke ezi nma, bú Onye sitere n'oge m'nọ n'afọ nnem kewaputam, site kwa n'amara-Ya kpọm,

16mb͕e ọ di Ya ezi nma ikpughe Ọkpara-Ya nimem, ka m'we zisa ozi ọma Ya n'etiti ndi mba ọzọ; ngwa ngwa mu na anu-aru na ọbara ab͕aghi ìzù:

17arigoghm kwa na Jerusalem jekuru ndi burum uzọ buru ndi-ozi: kama ejerem Arebia; we laghachi na Damaskọs ọzọ.

18Mb͕e ahu mb͕e arọ atọ gasiri arigorom na Jerusalem ileta Kifas, mu na ya we nọgide ubọchi iri na ise.

19Ma ahughm onye ọzọ n'etiti ndi-ozi, ma ọ bu nání Jemes nwa-nne Onye-nwe-ayi.

20Ma ihe ndia nke m'nēdegara unu, le, n'iru Chineke, na ekwughm okwu-ugha.

21Mb͕e ahu abiarurum akuku nile Siria na Silisia.

22Ma nzukọ nile nke Judia nke di nime Kraist nọ nāmaghi irum:

23ma ọ bu nání na ha nānu, si, Onye ahu nke nēsob͕u ayi n'oge gara aga, ọ nēzì ozi ọma ub͕u a nke okwukwe ahu nke ọ nēmebi n'oge gara aga;

24ha we nēnye Chineke otuto n'ihe ha huru n'arum.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help