ABÙ ỌMA 66 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù. Abù, bú Abú Ọma.

1Tikusienu Chineke nkpu ọǹù ike, uwa nile:

2Bùanu nsọpuru aha-Ya n'abù ọma:

Menu ka otuto-Ya di nsọpuru.

3Sinu Chineke, Le ka ọlu-Gi nile si di oké egwu!

N'uba nke ike-Gi ndi-iro-Gi gērube isi aghugho n'okpuru Gi.

4Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi,

Bùku kwa Gi abù ọma;

Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah

5Jenu, hu ọlu nile nke Chineke;

Onye di egwu ka Ọ bu n'omume-Ya n'ebe umu madu nọ.

6Ọ b͕anwere oké osimiri ka ọ ghọ ala-akọrọ:

Ha nāgabiga osimirí n'ukwu-ha:

Ka ayi ṅuria nime Ya n'ebe ahu.

7O ji idi-ike-Ya achi rue mb͕e ebighi-ebi;

Anya-Ya abua nēche mba nile nche:

Ka ndi nēwezuga onwe-ha ghara ibuli onwe-ha elu. Selah

8Gọzienu Chineke-ayi, unu ndi nile di iche iche,

Me-kwa-nu ka anu olu otuto-Ya:

9Onye na-etinye nkpuru-obi-ayi nime ndu,

Ọ kweghi kwa ka ewezuga ukwu-ayi n'ọnọdu-ha.

10N'ihi na I nwawo ayi, Chineke:

I nuchawo ayi, dika esi anucha ọla-ọcha.

11I mere ka ayi ma n'ọnyà;

I tukwasiwo n'úkwù-ayi ibu nānyib͕u ayi.

12I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n'elu isi-ayi;

Ayi bàra n'ọku na nime miri;

I we me ka ayi puta ba n'inwebiga-ihe-ókè.

13M'gēji ọtutu àjà-nsure-ọku ba n'ulo-Gi,

M'gākwughachi Gi nkwam nile m'kwere Gi,

14Nke eb͕ub͕ere-ọnum abua ji saghepu,

Nke ọnum kwu-kwa-ra, mb͕e nkpà dirim.

15Ọtutu àjà-nsure-ọku, bú anu nwere abuba, ka m'gēsurere Gi,

Ha na ihe-nsure-ọku nke nēsì ísì utọ nke ebulu;

M'gāchu oke-ehi n'àjà, ha na nkpi. Selah

16Bianu, nuru, unu nile ndi nātu egwu Chineke,

M'gākọ kwa akukọ bayere ihe O meworo nkpuru-obim.

17Ya ka m'jiri ọnum kpọkue,

Nbuli-elu di kwa n'okpuru irem.

18Ọ buru na ọ bu ajọ ihe ka m'leworo anya nime obim,

Onye-nwe-ayi agaghi-anu olum:

19N'ezie Chineke anuwo olum;

Ọ ṅawo nti olu ekerem.

20Onye agọziri agọzi ka Chineke bu,

Onye nēwezugaghi ekperem, O sighi kwa n'ebe m'no wezuga ebere-Ya.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help