I. NDI-EZE 2 - Bible Lgbo

1Ma ubọchi Devid biaruru nso ka ọ nwua; o we nye Solomon, bú nwa-ya, iwu, si,

2Mu onwem nēje n'uzọ uwa nile: ma di ike, buru kwa nwoke;

3debe kwa ihe-ndebe nke Jehova, bú Chineke-gi, ije n'uzọ-Ya nile, idebe ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-ya nile, na ihe-àmà-Ya nile, dika ihe edere n'iwu Moses si di, ka i we nwe uche n'ihe ọ bula nke i nēme, na n'ebe ọ bula i nēche iru-gi:

4ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.

5Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua.

6Gi me kwa dika amam-ihe-gi si di, ma ekwela ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'udo.

7Ma mere umu Bazilai, bú onye Gilead, ebere, ka ha di kwa n'etiti ndi nēri ihe na table nke gi: n'ihi na otú a ka ha biakuterem mb͕e m'b͕apuru n'iru Absalom, bú nwa-nne-gi.

8Ma, le, ọ di n'aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n'ubọchi m'jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m'we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M'gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli.

9Ma ub͕u a agula ya n'onye ikpe nāmaghi, n'ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'ọbara.

10Devid we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid.

11Ma ubọchi Devid bu eze Israel di ọgu arọ abua: arọ asa ka ọ bu eze na Hebron, orú arọ na iri na atọ ka ọ bu kwa eze na Jerusalem.

12Solomon we nọkwasi n'oche-eze Devid nna-ya: ewe me ka ala-eze-ya guzosie ike nke-uku.

13Adonaija nwa Hagit we biakute Bat-sheba nne Solomon. Ọ si, Ọ̀ bu n'udo ka i biaworo? Ọ si, Ọ bu n'udo.

14Ọ si kwa, Enwerem okwu igwa gi. Ọ si, Kwue.

15Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.

16Ma ub͕u a otù aririọ ka mu onwem nāriọ n'aka-gi, achughachila irum. Ọ si ya Kwue.

17Ọ si, Biko, si Solomon, bú eze, (n'ihi na ọ gaghi-achughachi iru-gi,) ka o nyem Abishag, bú nwayi Shunem, na nwunye.

18Bat-sheba we si, Ọ di nma; mu onwem gāgwara gi eze okwu.

19Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n'oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n'aka-nri-ya.

20Ọ si, Ọ bu aririọ ntà ka mu onwem nāriọ n'aka-gi; achughachila irum. Eze we si ya, Riọ, nnem: n'ihi na m'gaghi-achughachi iru-gi.

21Ọ si, Ka ewere Abishag, bú nwayi Shunem, nye Adonaija, bú nwa-nne-gi, na nwunye.

22Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n'ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia.

23Eze, bú Solomon, we were Jehova ṅua iyi, si, Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, asi na ọ bughi imegide ndu-ya ka Adonaija kwuworo okwu a.

24Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.

25Eze, bú Solomon, we zìe ozi n'aka Benaia nwa Jehoiada; o we dakwasi ya, o we nwua.

26Eze we si Abaiata, bú onye-nchu-àjà, La n'Anatot, rue ubi-gi; n'ihi na nwoke kwesiri ọnwu ka i bu: ma m'gaghi-eme ka i nwua n'ubọchi ta, n'ihi na i būru ib͕e Onye-nwe-ayi Jehova n'iru Devid, bú nnam, na n'ihi na ewedara gi n'ala n'ihe nile nke ewedara nnam n'ala nime ya.

27Solomon we chupu Abaiata ka ọ ghara iburu Jehova onye-nchu-àjà; ka o we me ka okwu Jehova rè, bú nke O kwuru bayere ulo Ilai nime Shailo.

28Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.

29Ewe gosi eze, bú Solomon, si, Joab ab͕alagawo n'Ulo-ikwū Jehova, ma, le, ọ nọ n'akuku ebe-ichu-àjà. Solomon we ziga Benaia nwa Jehoiada, si, Je, dakwasi ya.

30Benaia we biarue Ulo-ikwū Jehova, si ya, Otú a ka eze siri, Puta. Ọ si, É-è; kama n'ebe a ka m'gānwu. Benaia we weghachiri eze okwu, si, Otú a ka Joab kwuru, ọ bu kwa otú a ka ọ zaram.

31Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.

32Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.

33Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.

34Benaia nwa Jehoiada we rigo, dakwasi ya, me ka ọ nwua; ewe lìe ya n'ulo-ya n'ọzara.

35Eze we tiye Benaia nwa Jehoiada n'ọnọdu-ya ka ọ buru onye-isi usu-ndi-agha: Zedok, bú onye-nchu-àjà, ka eze tiyere n'ọnọdu Abaiata.

36Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Wuere onwe-gi ulo na Jerusalem, biri n'ebe ahu, esi-kwa-la n'ebe ahu pua je ebe ọ bula.

37O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.

38Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.

39O rue, n'ọgwugwu arọ atọ, na ndi-orù abua Shimai nwere b͕akuru Ekish, nwa Meaka, eze Gat. Ha we gosi Shimai, si, Le, ndi-orù-gi nọ na Gat.

40Shimai we bilie, jikwa inyinya-ibu-ya, jerue Gat, jekuru Ekish, ichọ ndi-orù-ya: Shimai we je, me ka ndi-orù ya si na Gat biaghachi.

41Ewe gosi Solomon na Shimai esiwo na Jerusalem je rue Gat, lata kwa.

42Eze we ziga kpọ Shimai, si ya, Èmeghm ka i were Jehova ṅua iyi, m'we b͕ara gi àmà, si, Mara nke-ọma, na i ghaghi inwu n'ubọchi i gāpu je n'ebe ọ bula? i we sim, Ọ di nma, bú okwu m'nuru.

43Ọ̀ bu kwa gini mere i nēdebeghi iyi Jehova, na ihe enyere n'iwu nke m'nyere gi n'iwu?

44Eze si-kwa-ra Shimai, Gi onwe-gi mara ihe ọjọ nile nke obi-gi mara, nke i mere Devid, bú nnam: Jehova gēme kwa ka ihe ọjọ gi laghachi n'isi-gi.

45Ma eze, bú Solomon, bu onye agọziri agọzi, agēme kwa ka oche-eze Devid guzosie ike n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi.

46Eze we nye Benaia nwa Jehoiada iwu; ọ pua, dakwasi ya, ọ we nwua. Ewe me ka ala-eze guzosie ike n'aka Solomon.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help