1Mu na anyam abua b͕ara ndu;
M'gēsi kwa aṅa lekwasi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke anya?
2N'ihi na gìni bu òkè nke Chineke sitere n'elu?
Ma-ọbu ihe-nketa nke Onye puru ime ihe nile sitere n'ebe di elu?
3Ọ̀ bughi nhuju-anya n'ebe onye ajọ omume nọ,
Na oké ahuhu n'ebe ndi nēme ajọ ihe nọ?
4Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile,
Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?
5Ọ buru na mu na ihe-efu yikọrọ jeghari,
Ọ buru kwa na ukwum ab͕aso aghughọ ọsọsọ;
6(Ka Ọ tùam n'ihe-ọtùtù ezi omume,
Ka Chineke mara kwa izu-okèm;)
7Ọ buru na nzọ-ukwum esi n'uzọ wezuga onwe-ya,
Ọ buru kwa na obim ejesowo anyam abua n'azu,
Ọ buru kwa na ọlu ọ bula araparawo n'ọbu-akam abua:
8Ka m'gha nkpuru, ma ka onye ọzọ rie;
Ka eropu kwa umu nke putara n'arum.
9Ọ buru na arafue obim ijekuru nwayi,
M'we che anwu n'ọnu-uzọ madu-ibem:
10Ka nwunyem gwere nwoke ọzọ nri,
Ka ndikom ọzọ ruru kwa ala n'elu ya.
11N'ihi na nke ahu bu nzube ọjọ;
Ọzọ, nke ahu bu ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:
12N'ihi na ọku ka ọ bu, rue ebe-ila-n'iyì ka ọ nēripia,
Ọ gēropu kwa ihe-ọmumem nile.
13Ọ buru na ajum okwu-ikpé orùm nwoke ma-ọbu orùm nwayi,
Mb͕e mu na ha nēse okwu:
14Gini ka m'gēme kwa mb͕e Chineke nēbili?
Mb͕e Ọ nēleta kwa, gini ka m'gāzaghachi Ya?
15Ọ̀ bughi Onye ahu Nke merem nime afọ mere ya?
Ọ̀ bughi otù Onye dozi-kwa-ra ayi abua nime àkpà-nwa?
16Ọ buru na eb͕ochiem ndi nēnweghi ike n'ihe nātọ ha utọ,
Ọ buru kwa na emem ka anya nwayi di-ya nwuru dala n'isi;
17Ọ buru kwa na eriem nbì-aka-nrim, náním,
Ma nwa-nb͕ei erighi nime ya;
18(Kama site na mb͕e m'di na nwata o tozuru n'akam dika n'aka nna-ya,
Ọ bu kwa site n'afọ nnem ka m'buru nwayi di-ya nwuru onye-ndú;)
19Ọ buru na ahum madu nāla n'iyì site n'enweghi uwe,
Ọ buru kwa na ob͕eye enweghi ákwà-nb͕okwasi;
20Ọ buru na úkwù-ya agọzighm,
Ọ buru kwa na esiteghi n'aji aturum me ka aru di ya ọku;
21Ọ buru na efewom akam megide nwa-nb͕ei,
N'ihi na m'nāhu onye-iye-akam n'ọnu-uzọ-ama:
22Ka ubum si n'azu-ubu-ya dapu,
Ka etijipu kwa ogwe-akam n'ọkpukpu-ya.
23N'ihi na nhuju-anya Chineke burum oké egwu,
Site kwa na nweli-elu-Ya apughm ime ihe ọ bula.
24Ọ buru na emewom ọla-edo ka ọ buru okwukwe efum,
Ọ buru kwa na asiwom ọla-edo ọma, I bu ntukwasi-obim;
25Ọ buru na aṅuriam ọṅu n'ihi na àkùm riri nne,
Na n'ihi na akam achọtawo àkú uku;
26Ọ buru na ajum ìhè mb͕e o nēnwu,
Ma-ọbu ọnwa mara nma mb͕e ọ nāga ije;
27Ewe rafue obim na nzuzo,
Akam we sutu ọnum ọnu:
28Nke ahu bu kwa ajọ omume ndi-ikpe gēkpe:
N'ihi na n'ime ihe a m'gāgọnari Chineke Nke di n'elu.
29Ọ buru na aǹuriam n'ọdida nke onye nākpọm asi,
Ma-ọbu kpọte onwem mb͕e ihe ọjọ chọtara ya;
30(Ma enyeghm okpo-ọnum uzọ imehie
N'iji ọb͕ub͕a-iyi riọ ndu-ya;)
31Ọ buru na ndikom ulo-ikwūm asighi,
Ọ gādi ayi nọ̄ nma ma asi na ayi ahu onye nējighi anu-ya riju afọ!
32Ọ bughi n'èzí ka ọbìa nānọ ọnọdu-abali;
Anam emeghe ọnu-uzọm n'ebe uzọ-amá di.
33Ọ buru na ekpuchiwom njehiem nile dika Adam,
N'izobe ajọ omumem n'obim,
34N'ihi na anamama jijiji ìgwè madu bara uba,
Na n'ihi na nleda-anya nke ab͕uru nile nēmem ka m'tua ujọ,
M'we nọ dū, ghara isi n'ọnu-uzọ pua-
35Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na enwerem onye gēgem nti!
(Le, akàràm, ka Onye puru ime ihe nile zam;)
Ọ gādikwam nọ̄ nma ma asi na enwerem akwukwọ nke o deworo, bú nwoke mu na ya nēse okwu!
36N'ezie n'ubum ka m'gēburu ya;
M'gēke kwa ya n'isim dika okpu-eze.
37M'gēgosi Ya ọnu-ọgugu nzọ-ukwum;
Dika onye-ndú ka m'gābiaru Ya nso.
38Ọ buru na alam etie nkpu megidem,
Ọ buru kwa na ọ̀b͕à-ya nile akwakọ ákwá;
39Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego,
Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:
40Ka ọhia-ogwu puta n'ọnọdu ọka wheat,
Ka ahihia nēsì ísì ọjọ puta kwa n'ọnọdu ọka barley.
Okwu Job agwusia.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.