1Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata,
Ayi di ka ndi nārọ nrọ.
2Mb͕e ahu ọchì nēju ayi ọnu,
Iti-nkpu-ọṅù nēju kwa ayi ire:
Mb͕e ahu ha nāsi n'etiti mba nile,
Jehova emeworo ndia ihe uku.
3Jehova emeworo ayi ihe uku;
Ayi nāṅuri ọṅu.
4Jehova, me ka ndi-ayi adọtara n'agha lata,
Dika miri-iyi di iche iche nime Negeb.
5Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.
6Onye nēbu nju-aka nkpuru-ọghigha, ọ bu ezie na ọ nēje ije nākwa ákwá;
Ma ọ ghaghi iwere iti-nkpu-ọṅù biaghachi, nēbu ùkwù-ọka-ya nile.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.