ABÙ NKE ABÙ 1 - Bible Lgbo

1Abù nke abù, nke diri Solomon.

2Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum:

N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.

3Manu-otite-gi nile nēsì ísì ọma;

Manu-otite nke nēsì ísì utọ nke awusiri awusi ka aha-gi bu;

N'ihi nka ka umu-ab͕ọghọ huworo gi n'anya.

4Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso:

Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya:

Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi,

Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine:

N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.

5Onye oji ka m'bu, ma amaram nma,

Unu umu-ndinyom Jerusalem,

Dika ulo-ikwū nile nke Kida,

Dika ákwà-nkwuba nile nke Solomon.

6Elelam anya, n'ihi na mu onwem nēji nji,

N'ihi na anyanwu achawom.

Umu nke nnem wesaram iwe di ọku,

Ha dorom onye-nche ubi-vine-ha nile;

Ma ubi-vine nkem, nke m'nwere, ka m'nēcheghi.

7Gosim, gi onye nkpuru-obim huworo n'anya,

Ebe i nāzù ìgwè aturu-gi, ebe i nēme ka ha makpu n'etiti-ehihie:

N'ihi na ọ̀ bu n'ihi gini ka m'gādi ka nwanyi ekpuchiri ekpuchi,

N'akuku ìgwè aturu nile nke ndi ejikọtara gi na ha?

8Ọ buru na i maghi, gi onye mara nma n'etiti ndinyom,

Puara onwe-gi so na nzọ-ukwu nile nke ìgwè ewu na aturu,

Zù kwa umu-ewu-gi n'akuku ebe-obibi nile nke ndi-ọzùzù-atutu.

9Inyinyam nke di n'ub͕ọ-ala Fero

Ka m'wereworo gi tuara, gi eyìm.

10Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa,

Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.

11Ihe-ọkpukpa di iche iche nke ọla-edo ka ayi gēmere gi,

Ya na nkpọchi ọla-ọcha.

12Mb͕e eze nọ n'oche-ya di buruburu,

Manu nard nkem sìpuru ísì utọ ya.

13Ùkwù myrrh ka onye ihe-ya nātọm utọ burum,

N'etiti aram abua ka ọ nānọ ọnọdu-abali.

14Uyọkọ nke okoko henna ka onye ihe-ya nātọm utọ burum

N'ubi-vine nke En-gedi.

15Le, i mara nma, eyìm; le, i mara nma;

Anya-gi abua di ka nduru.

16Le, i mara nma, gi onye ihe-gi nātọm utọ, e, i di utọ:

Ọzọ, ebe ayi nēdina nācha akwukwọ ndu.

17Ntuhie nile nke ulo-ayi nile bu cedar,

Age-ulo-ayi nile bu asisi fir.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help