AISAIA 58 - Bible Lgbo

1Were akpiri kpọ nkpu, eb͕ochila, welie olu-gi dika opì-ike, we gosi ndim njehie-ha, gosi kwa ulo Jekob nmehie-ha.

2Ma Mu ka ha nāchọ kwa-ubọchi, imara uzọm nile nātọ kwa ha utọ: dika mba nke mere ezi omume, nke nārapughi kwa ikpé nke Chineke-ha, ha nāriọm ikpé nile nke ezi omume, ibiaru Chineke nso nātọ ha utọ.

3Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.

4Le, ọ bu n'ihi ise-okwu na ilu-ọ̀gù ka unu nēbu ọnu, ya na iwere ọkpọ nke nmebi-iwu tib͕ue: unu adighi-ebu ọnu dika ta ime ka anuru olu-unu n'elu.

5Ọ̀ bu dika nka ka obubu-ọnu nke M'nārọputa bu? bú ubọchi madu gēweda nkpuru-obi-ya n'ala? Ọ̀ bu iruda isi-ya n'ala dika amì, na ib͕asa-ákwà-nkpe na ntu n'okpuru ya? ọ̀ bu nka ka i gākpọ obubu-ọnu na ubọchi nātọ Jehova utọ?

6Ọ̀ bughi nka bu obubu-ọnu M'nārọputa? itọpu ab͕u nile nke nmebi-iwu, itọsa ihe-ọkiké nile nke yoke, na izilaga ndi anēmeb͕u emeb͕u ka ha nwere onwe-ha, ka unu tiji kwa yoke ọ bula?

7Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?

8Mb͕e ahu ka ìhè-gi gāwaputa dika ututu, anu-aru ọhu gēpuchi kwa n'aru-gi ngwa ngwa: ezi omume-gi gāga kwa n'iru gi: nsọpuru Jehova gāga n'azu gi.

9Mb͕e ahu ka i gākpọ òkù, Jehova gāza kwa; i gētiku Ya, Ọ gāsi kwa, Lekwam. Ọ buru na i si n'etiti gi wezuga yoke ahu, na nsetipu nkpisi-aka, na ikwu ajọ ihe;

10ọ buru kwa na i weputara onye agu nāgu ihe nkpuru-obi-gi chọrọ, ọ buru na i me ka afọ ju nkpuru-obi ewedara n'ala; ìhè-gi gāwa nime ọchichiri, oké ọchichiri-gi gādi kwa ka etiti-ehihie:

11Jehova ganēdu kwa gi mb͕e nile, me ka afọ ju nkpuru-obi-gi n'ebe nile nkpọrọ nku, Ọ gēme kwa ka ọkpukpu-gi nile di ike; i gādi kwa ha ubi ab͕ara ogige nke dere miri nke-ọma, di kwa ka ebe miri nāsuputa nke miri-ya nādighi-ata ata.

12Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.

13Ọ buru na i me ka ukwu-gi si n'ubọchi-izu-ike chighari, i we ghara ime ihe nātọ gi utọ n'ubọchi nsọm; ọ buru kwa na i kpọ ubọchi-izu-ike ihe-utọ, i kpọ kwa ihe nsọ nke Jehova ihe-nsọpuru; i we sọpuru ya, ghara ime ihe bu uzọ-gi nile, ghara ichọputa ihe nātọ gi utọ ma-ọbu ikwu okwu nke aka gi:

14mb͕e ahu ihe Jehova gātọ gi utọ; M'gēme kwa ka i nọkwasi ebe nile di elu nke uwa dika inyinya; M'gēme kwa ka i rie ihe-nketa nke Jekob, bú nna-gi: n'ihi na ọnu Jehova ekwuwo.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help