II. IHE EMERE 16 - Bible Lgbo

1N'arọ nke-orú-na-iri-na-isi nke Esa bu eze, Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.

2Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,

3Ọb͕ub͕a-ndu di n'etiti mu na gi, na n'etiti nnam na nna-gi: le, eziteworom i ọla-ọcha na ọla-edo; je, mebie ọb͕ub͕a-ndu gi na Beasha, bú eze Israel, b͕ara, ka o we si n'arum rigo.

4Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel; ha we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-maim, na ulo-nchikọbata-ihe nile nke obodo Naftali nile.

5O rue, mb͕e Beasha nuru ya, na ọ rapuru iwu Rema, me ka ozi-ya ahu kwusi.

6Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa'

7Ma na mb͕e ahu Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, biakutere Esa, bú eze Juda, si ya, N'ihi na i dabeworo n'eze Siria, ma i dabeghi na Jehova, bú Chineke-gi, n'ihi nka usu-ndi-agha eze Siria esiwo n'aka-gi wepuga onwe-ya.

8Ndi Etiopia na ndi-Lubim, hà abughi usu-ndi-agha n'uba, nēnwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya bara uba nke-uku? ma mb͕e i dabere na Jehova, O nyere ha n'aka-gi.

9N'ihi na Jehova, anya-Ya nējeghari n'uwa nile, igosi Onwe-ya onye di ike n'akuku ndi obi-ha zuru okè n'ebe Ọ nọ. I bu onye-nzuzu na nka; n'ihi na site n'ub͕u a i gēnwe agha.

10Esa we wesa onye-ọhu-uzọ ahu iwe, tiye ya n'ulo ọtọsi; n'ihi na o nēkosa ya ọnuma n'ihi ihe a. Esa we zọpia ufọdu nime ndi-ya na mb͕e ahu.

11Ma, le, ihe nile Esa mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, edewo ha n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel.

12Esa we ria ọria n'ukwu-ya abua n'arọ nke-orú-na-iri-na-iteghete ọ bu eze; ọria-ya di uku ri nne: ọzọ kwa, n'ọria-ya ọ chọghi Jehova, kama ọ chọrọ n'etiti ndi-dibia.

13Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, ọ nwua n'arọ nke-ọgu-abua-na-otú ọ bu eze.

14Ha we lìe ya n'ili ya, nke o gwuwara nye onwe-ya n'obodo Devid, ha we me ka o dina n'ihe-ndina nke emejuru n'uda di iche iche na ihe di iche iche asugwara asugwa n'ọlu onye nāsugwa manu nēsì ísì utọ: ha we surere ya oké nsure-ọku di uku.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help