ABÙ ỌMA 5 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; nke agābù n'ib͕u Ọjà. Abù Ọma Devid.

1Ge nti n'okwu-ọnum, Jehova,

Ghọta ntughari-uchem.

2Ṅa nti n'olu ntiku m'nētiku Gi, Ezem, na Chinekem:

N'ihi na ọ bu Gi ka m'nēkpere.

3Jehova, n'ututu ka I gānu olum;

N'ututu ka m'gēdoro Gi ekperem n'usoro, che kwa nche.

4N'ihi na ọ bughi Chineke nke nmebi-iwu nātọ utọ ka I bu:

Ihe ọjọ agaghi-anọ dika ọbia n'ebe I nọ.

5Ndi nānya isi agaghi-eguzo onwe-ha n'anya-Gi:

I kpọrọ ndi nile nālu ajọ ihe asì.

6I gēme ka ndi nile nēkwu okwu-ugha la n'iyì:

Madu nke bu onye-ọbara na onye- aghughọ, Jehova nākpọ ya onye-árú.

7Ma mu onwem, n'uba nke ebere-Gi ka m'gābà n'ulo-Gi:

M'gākpọ isi ala n'ebe ulo uku nsọ Gi di n'egwu-Gi.

8Jehova, dubem n'ezi omume-Gi n'ihi ndi nēchem anwu;

Me ka uzọ-Gi zie ezi n'irum.

9N'ihi na ọ dighi ihe nke nēguzosi ike di n'ọnu-ya;

Ime-ha bu ila-n'iyì nile:

Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu;

Ha nēkwu okwu ire-utọ.

10Ma ha ikpe, Chineke;

Ka ha da ada site na ndum-ọdu nile ha:

N'uba nke njehie nile ha nupu ha;

N'ihi na ha anupuwo isi imegide Gi.

11Ma ka ndi nile ndi nābabà nime Gi ṅuria,

Ka ha tie nkpu ọṅù rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na I nēkpuchi ha ǹdò:

Ọzọ, ka obi nke ndi nāhu aha-Gi n'anya tọ ha utọ nime Gi.

12N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume;

Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help