I. IHE EMERE 18 - Bible Lgbo

1O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala, o we nara n'aka ndi Filistia Gat na umu-obodo-ya.

2O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.

3Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n'akuku osimiri Yufretis.

4Devid we napu n'aka-ya nnù ub͕ọ-ala abua na ọgu iri, na nnù ndi-inyinya iri-na-asa na ọgu iri, na orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri, bú ndi ji ukwu eje: Devid bipu-kwa-ra nkwonkwo-ukwu inyinya ub͕ọ-ala nile, ma o kwere ka ọgu inyinya ub͕ọ-ala ise fọdu n'etiti ha.

5Siria Damaskọs we bia iyere Hedareza, bú eze Zoba, aka, Devid we tib͕ue n'etiti ndi Siria orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri-na-ise.

6Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs; Siria we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

7Devid we chiri ọta ọla-edo nke dikwasiri ndi-orù Hedareza, chita ha na Jerusalem.

8Devid we si na Tibhat, si kwa na Kun, bú obodo Hedareza, chiri ọtutu ọla nke-uku, nke Solomon ji me oké osimiri ọla ahu, na ogidi nile, na ihe ọla nile.

9Tou, bú eze Hemat, we nu na Devid etib͕uwo usu-ndi-agha nile nke Hedareza, bú eze Zoba;

10o we zìe Hadoram nwa-ya jekuru eze, bú Devid, iju ya ajuju bayere udo-ya, na igọzi ya, n'ihi na o busoworo Hedareza agha, we tib͕ue ya; n'ihi na nwoke nke nēbuso Tou agha nke-uku ka Hedareza bu; ihe nile nke ọla-edo na nke ọla-ọcha na nke ọla di kwa n'aka Hadoram.

11Ihe ndia ka eze, bú Devid, do-kwa-ra nsọ nye Jehova, tiyere ọla-ọcha na ọla-edo ahu nke o butere site na mba nile; site n'Edom, site kwa na Moab, site kwa n'umu Amon, site kwa na ndi Filistia, site kwa n'Amalek.

12Abishai nwa Zeruaia tib͕u-kwa-ra Edom nime Ndagwurugwu Nnù. orú nnù ndikom uzọ abua na nnù ise.

13O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.

14Devid we buru eze Israel nile; o we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere m'ikpe na ezi omume.

15Joab nwa Zeruaia bu onye-isi usu-ndi-agha; Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta.

16Zedok nwa Ahaitub, na Abimelek nwa Abaiata, bu ndi-nchu-àjà; Shavsha bu ode-akwukwọ;

17Benaia nwa Jehoiada bu onye-isi ndi Keret na ndi Pelet; umu-ndikom Devid bu ndi-isi n'aka eze.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help