ABÙ ỌMA 44 - Bible Lgbo

Abù Ọma nke diri Onye-isi Abù; Abù Ọma nke umu Kora. Maschil.

1Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi,

Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.

2Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya;

I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.

3N'ihi na ọ bughi mma-agha-ha ka ha ji nweta ala ahu,

Ogwe-aka-ha azọputaghi kwa ha:

Kama ọ bu aka-nri-Gi, na ogwe-aka-Gi, na ìhè nke iru-Gi,

N'ihi na ihe-ha tọrọ Gi utọ.

4Gi onwe-gi bu Ezem, Chineke:

Nye nzọputa nile nke Jekob iwu.

5Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi:

Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.

6N'ihi na ọ bughi utam ka m'nātukwasi obi,

Mma-agham adighi-azọputakwam.

7Kama ọ bu Gi zọputaworo ayi n'aka ndi nākpab͕u ayi,

I mewo kwa ka ihere me ndi nākpọ ayi asì.

8Chineke ka ayi jiworo nya isi ogologo ubọchi nile,

Ọ bu kwa aha-gi ka ayi gēkele rue mb͕e ebighi-ebi. Selah

9Ma ub͕u a I juwo ayi aju, we tiye ayi n'ọnọdu-ihere;

I dighi-eso kwa usu-ndi-agha-ayi pua ije agha.

10I nēme ka ayi si n'iru onye-nkpab͕u laghachi azu:

Ọzọ, ndi nākpọ ayi asì nāpunara ayì ihe nye onwe-ha.

11I nēme ayi ka ayi di ka ìgwè aturu agēri eri;

N'etiti mba nile ka I fesawo-kwa-ra ayi.

12I nēre ndi-Gi ma I naraghi ihe-ọnu-ahia,

I meghi ka àkù-Gi ba uba site n'ọnu-ahia-ha.

13I nēme ayi ka ayi ghọro ndi-ab͕ata-obi-ayi ihe-ita-uta,

Ka ayi ghọrọ ndi di ayi buruburu ihe-ọchì na ihe-ikwa-emò.

14I nēme ayi ilu n'etiti mba nile,

Nfufe-isi n'etiti ndi nile di iche iche.

15Ogologo ubọchi nile ka onodu-iherem di n'irum,

Ihere irum ekpuchiwokwam,

16N'ihi olu ita-uta na onye-nkwulu;

N'ihi onye-iro na onye nābọ̀ ọ́bọ̀.

17Ihe nile a abiakwasiwo ayi; ma ayi echezọghi Gi,

Ayi ekwughi kwa okwu-ugha n'ọb͕ub͕a-ndu-Gi

18Obi-ayi alaghachighi azu,

Nzọ-ukwu-ayi esighi kwa n'uzọ-Gi wezuga onwe-ha;

19Na I gwepiawo ayi n'ọnọdu nkita-ọhia,

Were kwa onyinyo ọnwu kpuchie ayi.

20Ọ buru na ayi echezọwo aha Chineke-ayi,

We b͕asapuru chi ala ọzọ ọbu-aka-ayi;

21Chìneke agaghi-egwuputa ala ihe a?

N'ihi na Ya onwe-ya mara ihe-nzuzo nile nke obi.

22N'ezie n'ihi Gi ka eb͕uworo ayi ogologo ubọchi nile;

Aguwo ayi dika ìgwè ewu na aturu agēb͕u eb͕u.

23Teta, n'ìhi gini ka I nāraru ura, Onye-nwe-ayi?

Teta n'ura, ajula ayi aju rue mb͕e ebighi-ebi.

24N'ìhi gini ka I nēzobe iru-Gi?

N'ìhi gini ka I nēchezọ nweda-n'ala-ayi na nmeb͕u-ayi?

25N'ihi na nkpuru-obi-ayi erudawo n'ala rue ájá:

Afọ-ayi araparawo n'ala.

26Bilie iyere ayi aka,

B͕aputa kwa ayi n'ihi ebere-Gi.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help