1Ma ọ dighi unu nkpà, umu-nna-ayi, ka edegara unu akwukwọ bayere oge ahu nile na ubọchi ahu nile.
2N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.
3Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.
4Ma unu onwe-unu, umu-nna-ayi, anọghi n'ọchichiri, ka ubọchi ahu we jide unu na mberede dika onye-ori:
5n'ihi na unu onwe-unu nile bu umu nke ìhè, na umu nke ehihie: ayi abughi ndi nke abali, ma-ọbu nke ọchichiri;
6ya mere otú a, ka ayi ghara iraru ura, dika ndi fọduru, kama ka ayi nēche nche nwe kwa anya-udo.
7N'ihi na ndi nāraru ura nāraru ura n'abali; ndi nāṅubiga kwa manya ókè nāṅubiga n'abali.
8Ma ayi onwe-ayi, ebe ayi bu ndi nke ehihie, ka ayi nwe anya-udo, yikwasikwa ihe-agha ib͕ochi obi, bú okwukwe na ihunanya; ya na okpu-agha, bú ile-anya nzọputa.
9N'ihi na Chineke edebeghi ayi inata iwe, kama inweta nzọputa site n'aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist,
10Onye nwuru n'ihi ayi, ka ọ gābu, ma ayi nēche nche ma ayi nāraru ura, ka ayi we so Ya dikọ ndu.
11N'ihi nka nākasiritanu ibe-unu obi, wulirita kwa ibe-unu elu dika ulo, dika unu nēme kwa.
12Ma ayi nēkpere unu, umu-nna-ayi, ka unu mata ndi nādọb͕u onwe-ha n'ọlu n'etiti unu, ndi bu kwa ndi-isi-unu nime Onye-nwe-ayi, ndi nādu kwa unu ọdú;
13ka unu were kwa ihunanya sọpuru ha gabiga ókè nke-uku ri nne n'ihi ọlu-ha. Birinu n'udo n'etiti onwe-unu.
14Ma ayi nāriọ unu, umu-nna-ayi, nādunu ndi nādighi-agazi ije ọdú, nakasinu ndi dara #mbà n'obi, nēyerenu ndi nādighi ike aka, nwenu ogologo-ntachi-obi n'ebe madu nile nọ.
15Lenu ka onye ọ bula ghara inyeghachi onye ọ bula ihe ọjọ n'ọnọdu ihe ọjọ; kama nāb͕asonu ezi ihe mb͕e nile, n'ebe ibe-unu nọ, na n'ebe madu nile nọ.
16Nāṅurinu ọṅu mb͕e nile;
17nēkpenu ekpere nēwepughi aka;
18nēkelenu ekele n'ihe nile ọ bula: n'ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ nime Kraist Jisus n'ebe unu nọ.
19Unu emenyula Mọ Nsọ;
20unu akpọla ibu-amuma ihe-efu;
21nānwanu ihe nile; jidesienu ihe ọma ike;
22unu etiyela aka n'aha ajọ ihe ọ bula.
23Chineke nke udo, Ya Onwe-ya dozu kwa unu nsọ n'uzọ dum; ka edebezu kwa mọ-unu na nkpuru-obi-unu na aru-unu dum, nādighi ita uta n'ọbibia nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.
24O kwesiri ntukwasi-obi, bú Onye ahu nākpọ unu, Onye gēme kwa ya.
25Umu-nna-ayi, nēkpenu ekpere bayere ayi.
26Werenu isutu-ọnu di nsọ kele umu-nna-ayi nile.
27Ewerem Onye-nwe-ayi b͕a unu iyi ka aguara umu-nna-ayi nile akwukwọ-ozi a.
28Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist dinyere unu.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.