1Jehova, Abalaram nba n'iwe-Gi,
Adọ-kwa-lam aka na nti n'ọnuma-Gi.
2Merem amara, Jehova; n'ihi na onye taworo aru ka m'bu:
Mem ka m'diri ndu, Jehova; n'ihi na ọkpukpum nile nāma jijiji.
3Nkpuru-obim nāma kwa jijiji nke-uku:
Ma Gi onwe-gi, Jehova, rùe ole mb͕e?
4Lata, Jehova, dọputa nkpuru-obim:
Zọputam n'ihi ebere-Gi.
5N'ihi na ọ dighi ncheta-Gi di n'ọnwu:
Nime ala-mọ ònye gēkele Gi?
6Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem;
Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim;
Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.
7Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri;
Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.
8Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe;
N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám.
9Jehova anuwo arirọ-amaram;
Jehova gānara ekperem.
10Ihere gēme ndi-irom nile, ha gāma kwa jijiji nke-uku:
Ha gālaghachi azu, ihere gēme ha na mberede.
Who We AreWhat We EelieveWhat We Do
2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.