ABÙ ỌMA 110 - Bible Lgbo

Abù Ọma Devid.

1Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim,

Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.

2Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa:

Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.

3Ndi-gi bu onyinye-afọ-ofufo n'ubọchi usu-ndi-agha-gi;

N'ima-nma nile nke idi-nsọ, site n'afọ nke ututu;

Gi nwe igirigi, bú umu-okorọbia-gi.

4Jehova aṅuwo iyi, Ọ gaghi-echèghari kwa uche-Ya,

Gi onwe-gi bu onye-nchu-àjà rue mb͕e ebighi-ebi

Dika usoro Melkizedek si di.

5Onye-nwe-ayi n'aka-nri-gi

Amapúwo ndi-eze n'ubọchi iwe-Ya.

6Ọ gēkpe ikpe n'etiti mba nile,

Ebe nile juputara n'ozu;

Ọ mapúwo isi madu n'elu ọtutu ala.

7Miri nke sitere na miri-iyi nke di n'uzọ ka Ọ gāṅu:

N'ihi nka ka Ọ gēweli isi-Ya elu.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help