II. NDI KỌRINT 13 - Bible Lgbo

1Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.

2Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;

3ebe unu nāchọ ihe inwaputa Kraist Onye nēkwu okwu nimem; Onye nābughi onye nādighi ike n'ebe unu nọ, kama Ọ di ike nime unu:

4n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.

5Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.

6Ma anamele anya na unu gāmara na ayi onwe-ayi abughi ndi ajuru aju.

7Ma ayi nēkpere Chineke ka unu ghara ime ihe ọjọ ọ bula; ọ bughi ka ayi onwe-ayi we puta ìhè, na ayi bu ndi anwaputara, kama ka unu onwe-unu we nēme ihe ọma, ka ayi onwe-ayi we di kwa ka ndi ajuru aju.

8N'ihi na ayi apughi ime ihe ọ bula megide ezi-okwu, kama ayi nēmere ezi-okwu ihe nile.

9N'ihi na ayi nāṅuri ọṅu, mb͕e ọ bula ayi onwe-ayi nādighi ike, ma unu onwe-unu di ike: nka ka ayi nēkpe-kwa-ra Chineke, bú ka eme ka unu zu okè.

10N'ihi nka ka m'nēde ihe ndia n'akwukwọ mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, ka m'we ghara iwere ihe-ike meso unu mb͕e m'nọ n'etiti unu, dika ike nke Onye-nwe-ayi nyerem si di, iwuli elu dika ulo, ọ bughi kwa ikwada akwada.

11Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.

12Werenu isutu-ọnu di nsọ kelerita ibe-unu.

13Ndi nsọ nēkele unu.

14Ka amara nke Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, na ihu-n'anya nke Chineke, na nnwekọ nke Mọ Nsọ, diyere unu nile.

Blog
About Us
Message
Site Map

Who We AreWhat We EelieveWhat We Do

Terms of UsePrivacy Notice

2025 by iamachristian.org,Inc All rights reserved.

Home
Gospel
Question
Blog
Help